
N’ụbọchị taa n’afọ 1967 ka onyeisiala ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ Chukwumemeka Ọdụmegwu Ojukwu gwara ụwa dum na Biafra e nwerela onwe ha n’aka Naịjirịa. Ihe mere Ojukwu ji kwuo hoo haa na Biafra agaghị eso Naịjirịa dịka otu obodo bụ maka na Yakubu Gowon laghachiri azụ n’ihe e kwekọrịtara n’Aburi, Gana.

Ihe ndị a e kwekọrịtara bụ ihe ga-enyere ndị Naịjirịa aka ibi n’udo ka otu obodo, tụmadị ka ndị Awụsa gbuchara ụmụ Igbo ka anụ ọhịa. Ihe ụnwụ a malitere mgbe Chukwuma Nzeọgwụ na ụfọdụ ndị soja gburu ụfọdụ ndị ọchịchị dịka Ahmadu Bello na Tafawa Balewa, maka kwenye ha na ha na-aghasa obodo. Nke a mere n’ụbọchị iri na ise, n’ọnwa Jenụwarị n’afọ 1966.
N’ezie, ọtụtụ ndị mmadụ, tụmadị ndị soja na ndị ọrụ oyibo bi n’Ugwu Awụsa nwere añụrị oge e gburu ndị a, maka ha kwenyere na ha na-egbochi ọganihu obodo. Mana obi mmadụ Chineke kere dị aghụghọ.
N’ihi ya, o ruo n’ụbọchị iri abụọ na iteghete, n’ọnwa Mee n’afọ 1966, ọgbaghara adaa n’Ugwu Awụsa. Ndị kpalitere nke a bụ ndị soja Awụsa. Iwe ha bụ na Agụiyi-Ironsi bụ onyeisiala ekweghị enye Nzeọgwụ na ndị otu ya ntaramahụhụ. Ọ bụ otu a ka e si malite gbuwe ụmụ Igbo aghara aghara, n’ihi kwenye ha na ụmụ Igbo bụ ndị gburu ụmụnne ha, werezịa ụzọ aghụghọ weghara ọchịchị n’aka ha.
N’ụbọchị iri abụọ na iteghete, ka chi ji ehihie wee jie mgbe e gburu Agụiyi-Ironsị. Ndị kpara mkpamkpa a bụkwa otu ndị soja Awụsa. Ụmụnne ha nọkwa n’Ugwu Awụsa malitere gbuwekwa ụmụ Igbo ọbụla ha hụrụ aghara aghara. Ọtụtụ ụmụ Igbo riri mbo mbo ọsọ gbalata ala Igbo, maka onye ọsọ chụrụ chulata ala nna ya, agbachala ihe ọ ga-agba n’ọsọ. Ọtụtụ n’ime ha gba aka wee lọta, maka a naghị agwa ochi ntị na agha esula. Ma ochi ntị anaghị anụ ihe, ọ na-ahụ ụzọ. Ọ bụkwa naanị osisi nụrụ na a ga-egbu ya kwụrụ.

Ọ bụ ihe ndị a mere ka Ojukwu, Gowon na ndị soja welitere isi n’ọchịchị gaa Aburi. Ebe a ka ha nọ tikọọ isi ọnụ banyere ihe ga-eme ka udo lọghachi na Naịjirịa, tụmadị n’ebe ụmụ Igbo nọ. Ka ha gachara kwubie, kwekọrịta, wee lọta, Gowon wee jụ, maa jubepụ isi na ndị Naịjirịa ekweghịzikwa n’ihe ndị ahụ.

Ozigbo, ndị ọchịchị ọdịnaala n’ọwụwa anyanwụ dum dọnyeere Ojukwu ukwu ka ala Biafra nwere onwe ha. Maka, o woro onye ọbụla anya na ndị ha na ha na-emekọ ihe abụghị ndị a ga-tụkwasị obi. Ihe sochiri nke a bụ agha Biafra, nke ihe karịrị nde mmadụ atọ nwụrụ n’ime ya.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

