Nwanne—Eriri Kacha Ejikọ N’ala Igbo.

''Nwanne abụọ nwee mmekọ, ma ha ama, ma ha amaghị, ọ bụ arụ. A ga-achọkwa ụzọ a ga-esi kpụọ ya bụ arụ. A chọkwaghị ịma, ma ihe jikọrọ unu abụ otu nne na nna maọbụ ụmụnne ha mụtara unu, ma ọ bụghị.''

Odee N’Asụsụ Bekee—Ozii Baba Anieto.

Ntụgharị– Somtochukwu Chiedu.

nwanne
Ezinaụlọ

Ka m bido site n’ikwu hoo haa na o nweghị ihe dịka kọzịnụ n’omenala ndị Igbo. N’agbanyeghị na o nweghị okwu Igbo kọwara kọzịnụ, omenaala Igbo megidere ihe ọbụla na-ekewa ezinụlọ. N’omenaala Igbo, nwanne dị omimi. Otu o si buo ibu ka ndị mmadụ si akwanyere ya ugwu, pụtara na ezinaụlọ ọbụla buru ibu abụghị nke ụmụmmadụ ji egwuri egwu, maka ka o sila dị, otu onye n’ime ha ga-abụrịrị mmadụ e ji eme ọnụ.

nwanne2
Ụmụnne

Nwanne abụọ nwee mmekọ, ma ha ama, ma ha amaghị, ọ bụ arụ. A ga-achọkwa ụzọ a ga-esi kpụọ ya bụ arụ. A chọkwaghị ịma, ma ihe jikọrọ unu abụ otu nne na nna maọbụ ụmụnne ha mụtara unu, ma ọ bụghị. Ihe mere ndị mmadụ ji ajụkarị ase tutu a lụọ di ma ọ bụ nwunye bụ ka ha matakwa na ọ bụghị nwanne ha ka ha na-alụ.

Ụfọdụ ndị Igbo abụrụla ndị ụkwụ kpọrọ na nke a. Ha zutere onye ha amaghị na mbụ, chọọ ịlụ ha. Ka ha na-agbakeri ala maka ịlụ di na nwunye, ha chọpụtara na ha abụọ bụ nwanne. Nwanne anakwaghị alụ nwanne. Nkwado ha niile ha mere, wee bụrụ ihe mara afọ n’ala.

Echetara m otu ụbọchị okenye sịrị m kọwaa otu mụ na otu nwaagbọghọ siri metụta, m wee sị ‘nne m tọrọ nne nke ya.’ Okenye ahụ zara sị ‘ọ kwa nwanne ime ụlọ.’ Nke a bụ omenala, dịkwazị omimi na ndụ ndị Igbo. Nwanne bụ eriri kachaa ejikọ n’ebe ndị Igbo nọ.

Ya mere e ji agụ mmadụ aha ndị a: Nwanneka, Nwannebụihe, na-ekwukwasị ‘iwe nwanne anaghị eru n’ọkpụkpụ. Onye gburu nwanne ya abụghị odogwu. Ụbọchị nwanne, enyi alaa.’

p square and jude
Pita, Paul na Jude Okoye

N’agbanyeghị na ụfọdụ na-ahụ ụzọ ndị gboo ka ndị nọ n’ọchịchịrị, mana nke bụ ezie bụna ndị gboo ma agbụrụ ha, marakwa ezinụlọ ha dum. Onye ọ bụla metụtara ezinụlọ ha bụkwasị onye a na-enye ihe ruru ya; oke ya anaghị efukwa.

Na nchịkọta, n’omenala Igbo, ihe a madebe ma ịbụ nwanne ka ị bụghị!


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.