N’ụbọchị taa n’afọ 1996 ka Kanụ Nwankwọ du ndị egwu futubọọlụ Naịjirịa wee nweta ọlaedo n’egwuregwu bọọlụ olimpiki na mba Atlanta, Amerịka.
Ha meriri ndị bọọlụ Argentina wee nweta ọlaedo ahụ. Mana nke ndị Naịjirịa agaghị echefu bụ meri ha meriri ndị Brazil, tutu ha ezute Argentina, na nke a gbaa, o bie.
Kanụ gosiri ndị Brazil na ụwa dum na ọ bụ odogwu n’egwuregwu bọọlụ mgbe o nyere goolu abụọ. Nke abụọ o nyere, a kpọrọ “golden goal” mere ka anyammiri malite rusisibe ndị bọọlụ Brazil n’anya ozigbo, tụmadị onye du ha bụ Bebeto.

Ha na-ebe, ndị obodo ha du ha bịa asọmpi ahụ ana-agụgụ ha, maka na ihe metụrụ anya, metụrụ imi.
Ka Bebeto gbadorozịrị aka n’ukwu wee na-achagharị anya ka onye ndị ohi wakporo, onye nta akụkọ bọọlụ n’ụbọchị ahụ nọkwa na-asị “Bebeto cannot believe this, nke pụtara, “nke a ekweghị Bebeto nghọta.”
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.



