Ncheta Onowu Chike Ọfọdịle(SAN)

"Mgbe Buhari bụ onye ọchịchị soja, ọ họpụtara ya wee mee ya "Attorney-General" na "Minister of Justice" nke ọ malitere n'afọ 1984 ruo afọ 1985."
20200802 164937

N’ụbọchị taa n’afọ 2014 ka Chike Ọfọdịle zara oku ọnwụ. Na ndụ ya, a mụrụ Chike n’ụbọchị iri abụọ n’ọnwa Nọvemba, n’afọ 1921. Ọ bụkwa nwaafọ Ọnịcha.

Ọ gara akwụkwọ praịmarị n’Imanuel Skul, St. Mary’s, si ebe ahụ gaa akwụkwọ sekọndịrị na “Christ the King, College” dịkwa n’Ọnịcha. Ọ rụrụ ọrụ n’ụfọdụ ebe n’ala Naịjirịa tutu ọ gawara Lọndọn, ebe ọ gụrụ, ma bụrụkwa ọkaikpe.

A nabatara ya dịka ọkaikpe na “NBA” n’afọ 1960. Ọ bụ na “Chambers” nwanne ya bụ Justice Ikpeazụ ka a pịchara ya nke ọma, o ji mata ihe ekwe na-akụ. A makwa Ọfọdịle dịka onye na-atachi obi ma na-esochikwa okwu dị n’ụlọikpe anya.

Nke a mere na ụfọdụ n’ime okwu ndị a so na ndị a na-arụtụ aka were ekpe ikpe n’akwụkwọ “Law Reports” ruo taa. Ọ hibere “chambers” nke ya n’afọ 1964. N’afọ 1979 ka e mekwara ya “Senior Advocate of Nigeria.”

Mgbe Buhari bụ onye ọchịchị soja, ọ họpụtara ya wee mee ya “Attorney-General” na “Minister of Justice” nke ọ malitere n’afọ 1984 ruo afọ 1985. Ebe ahịhịa niile juru ọhịa, nwaanyị ụbịam wee họrọ ọkazị, o nwere ihe ọkazị ji dị iche.

Onyeisiala Naịjirịa bụ Yar’Adua nyere ya onyinye nkwanye ugwu bụ “Order of the Federal Republic” n’afọ 2008, ebe Obi Ọnịcha bụ Alfred Achebe mere ya Onowu n’afọ 2003.

Ọfọdịle lara ezumike nka n’ọrụ ọkaikpe n’afọ 2009. Ọ rụrụ ọrụ ọkaikpe afọ iri ise. A ga-echeta ya maka mbọ ya n’ịkwalite “Nigerian Legal System.” Ọ gbakwara afọ iri iteghete na abụọ oge ọ nwụrụ.

N’ezie, Onowu Ọfọdịle bụ ọpụrụiche nke ndị ọgbọ ọhụrụ a kwesịrị ịṅomi.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.