
N’ụbọchị taa n’afọ 1994 ka Tony Ubesie zara oku ọnwụ. Tony bụ nnukwu odee n’asụsụ Igbo. Akwụkwọ ya abụghị ịkọ akụkọ n’efu, kama ọ na-eji ilu wee gbarie ihe dị ya n’uche. Nke a ne-enye onye na-agụ akwụkwọ ya obi ụtọ pụrụ iche, ma meekwa ka a mata uru ilu bara na ndụ ndị Igbo.
Taa, anyị ga-eleba anya n’ilu o jiri dee ụfọdụ akwụkwọ ya, were mata ma o nwere ihe mmụta anyị ga-amaburu.
Ụkwa Ruo Oge Ya Ọ Daa

“Mgbe okokporo bidoro jiri mmanya pụkuwe onye mụtara nwaagbọghọ ọrịrị, ọ bụghị naanị ọrịrị ka ọ na-apụ.”Pg. 37. Ilu a na-akọwa na a na-eji akọnauche were eso ihe dị oke mkpa.
Mmiri Ọkụ E Ji Egbu Mbe

“Ọgaranya mee ka ogbenye, e lelịa ya ka e lelịrị ogbenye.” Pg. 66.
Nkọwa ilu a bụ na a naghị agba aka a bụ onyeisi maọbụ ọgaranya. Maka ọgaranya bụ omume, omume. Anaghị a bụ ọgaranya, a bụ.
Ụkpana Okpoko Buuru.

“Nracha ụtụ abụghị okwu: na ebe okwu na ụka dị bụ n’ịnyụ mkpụrụ ya.” Pg. 50.
Mmadụ ekwesịghị iji ọsịịsọ kwere ịmee ihe. O ruo n’omume, ọ hịawa ahụ.
Isi Akwụ Dara N’ala.

“Egbe a gbara mmadụ na-abụ ọnya ya laa, ụfụ ya alaa. Ma nke e ji ọnụ gbaa anaghị ajụ ọkụ. Ọ dị ka e chezọwala ya, otu ihe echetara ya onye ahụ. Na ndụ Chike, o nwere ike ịgbaghara ihe Ada gwara ya, ma ọ dịghị ihe ga-eme ka o chezọọ ya, maka na nwa nkịta sị na ọsọ edi chụrụ ya bụ, ọsọ laa, atụ ya agaghị ala. Pg. 114 & 115.
Ọ na-ahịa ahụ ịchezọ ajọ okwu maọbụ omume mmadụ mesoro anyị.
Jụọ Obinna

“Obinna amabeghị na ọgaranya kechaa ekpe hapụ ịnwụ, ihere ọnwụ egbuo ya, maka na ihe bara mmadụ n’ọnụ arapụtaghị ya, nke si ya n’ọnụ pụta achịpụta ya ụkwụ n’ezi. Pg. 1.
Ilu a na-adụ ọdụ ka anyị ghara iji ọnụ were egbutu ukwu ọjị. O ruo n’omume, akụkọ akarịa. Dewe ọnụ gị duu. Ekwetala ihe ị gaghị emenwu.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

