
N’ụbọchị taa n’afọ 1924 ka a mụrụ Pius Ọkigbo. Na ndụ ya, ọ bụ onye Ojoto nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili South, Anambra Steeti. Pius na Chris Ọkigbo bụ nwanne. Mana ọ bụzị Pius ṅụchara ara wee hara Chris.
Pius gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị ya na “Christ the King College” dị na Ọnịcha. Ihe e ji mara Pius na Chris bụ na ụbụrụ ha na-anụ ọkụ nke ukwuu, nke mere nnukwu Ọkammụta bụ Chinua Achebe ji ekpupụrụ ha okpu.
N’ihi nke a, Pius nwetara nzere na Ịkọnọmics site n’akwụkwọ o ji aka ya gụọ, ma kụziere onwe ya. Ọ mechazịa nweta nzere M.A na PhD na mahadum Northwestern na mba Amerịka. N’ezie, odogwu a chị Ịkọnọmics na mbọ aka mere e ji akpọ ya ka o wepụta atụmatụ ga-enyere obodo aka.
Ọ gbara mbọ ịwepụta usoro ga-enye aka ka ụmụ mmadụ n’Afrịka dum ihe na-esiri ike malite hụwa tụtụrụ rachaa. Emekwara ya onye ndụmọdụ Ịkọnọmics nke “Eastern Region” ala Naịjirịa.
N’afọ 1994, ka o gosiri n’ezie na ihe a mụrụ amụ ka ihe a gwọrọ agwọ, mgbe ọ gbara ụlọakụ “CBN” n’anwụ. O ziri otu ha si were ojoro kọnyere ihe karịrị ijeri naịra iri na abụọ akụkọ.
Pius kwukwara hoo haa n’ihe na-akpụghachi Naịjirịa azụ bụ wuru wuru ndị ọchịchị, tinyere iji ego ọkpụrụkpụ were akwụ ụgwọ ego anyị bitere.
Ọ zara oku ọnwụ n’afọ 2000.
Daalụ nnụ.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

