Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ Pius Ọkigbo

"Pius kwukwara hoo haa n'ihe na-akpụghachi Naịjirịa azụ bụ wuru wuru ndị ọchịchị, tinyere iji ego ọkpụrụkpụ were akwụ ụgwọ ego anyị bitere."
20210125 122735

N’ụbọchị taa n’afọ 1924 ka a mụrụ Pius Ọkigbo. Na ndụ ya, ọ bụ onye Ojoto nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili South, Anambra Steeti. Pius na Chris Ọkigbo bụ nwanne. Mana ọ bụzị Pius ṅụchara ara wee hara Chris.

Pius gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị ya na “Christ the King College” dị na Ọnịcha. Ihe e ji mara Pius na Chris bụ na ụbụrụ ha na-anụ ọkụ nke ukwuu, nke mere nnukwu Ọkammụta bụ Chinua Achebe ji ekpupụrụ ha okpu.

N’ihi nke a, Pius nwetara nzere na Ịkọnọmics site n’akwụkwọ o ji aka ya gụọ, ma kụziere onwe ya. Ọ mechazịa nweta nzere M.A na PhD na mahadum Northwestern na mba Amerịka. N’ezie, odogwu a chị Ịkọnọmics na mbọ aka mere e ji akpọ ya ka o wepụta atụmatụ ga-enyere obodo aka.

Ọ gbara mbọ ịwepụta usoro ga-enye aka ka ụmụ mmadụ n’Afrịka dum ihe na-esiri ike malite hụwa tụtụrụ rachaa. Emekwara ya onye ndụmọdụ Ịkọnọmics nke “Eastern Region” ala Naịjirịa.

N’afọ 1994, ka o gosiri n’ezie na ihe a mụrụ amụ ka ihe a gwọrọ agwọ, mgbe ọ gbara ụlọakụ “CBN” n’anwụ. O ziri otu ha si were ojoro kọnyere ihe karịrị ijeri naịra iri na abụọ akụkọ.

Pius kwukwara hoo haa n’ihe na-akpụghachi Naịjirịa azụ bụ wuru wuru ndị ọchịchị, tinyere iji ego ọkpụrụkpụ were akwụ ụgwọ ego anyị bitere.

Ọ zara oku ọnwụ n’afọ 2000.

Daalụ nnụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.