Ncheta Tony Ubesie

Nnukwu Ọdee Akwụkwọ Ndị Igbo Ji Eme Ọnụ
20210127 121646 1

N’ụbọchị taa n’afọ 1950 ka a mụrụ Tony Ubesie. Na ndụ ya, Tony bụ onye Achị nke dị n’Oji River, Enugwu Steeti. Nna Tony bụ Igbochukwu Aaron kpachapụrụ anya n’ịzụ nwa ya nwoke. Ihe na-anụ ya ọkụ n’obi bụ ka Tony bụrụ ọkaibe n’asụsụ Igbo ma rarakwa onwe ya nye n’ihe gbasara ife Chukwu ofufe n’ụlọụka nzukọ Kraịst.

Tony ekwekwaghị ka olileanya nna ya nwere n’ebe ọ nọ bụrụ ihe efu. O mere ọfụma n’ule WASC nke o lere n’afọ 1966, ma turukwa ugo na nzere asụsụ ala Naịjirịa na Linguistics nke ọ gụrụ na mahadum Naịjirịa, Nsụka.

Tutu ọ banye mahadum n’afọ 1976, aha Ubesie abụrụla aha na-ewu ewu n’ọtụtụ ezinaụlọ n’ala Igbo dịka onye mgbasa ozi redio. Olu ya wetara nkasiobi na olileanya, n’ihi na ndị Igbo ka na-eru ụjụ ihe mere ha n’agha Biafra.

Ahụhụ ndị Igbo tara n’agha, na ihe mmụta so ya mere Tony jiri dee akwụkwọ ndị a: Isi Akwụ Dara N’ala(1973) na Jụọ Obinna(1977). Akwụkwọ ndị ọzọ dịka Mmiri Ọkụ E Ji Egbu Mbe(1974), Ụkwa Ruo Oge Ya Ọ Daa(1973) na Ụkpaka Mịịrị Onye Ụbịam (1975) gbasara ụdịrị ihe ndị ọzọ dapụtara ka agha biri, dịka izu ohi na nna ịkwanye nwa ya nwaanyị ịlụ di nwere ego.

Tony kwalitere asụsụ Igbo site na nghọta omenaala Igbo. Ọnwụ kpọrọ odogwu a oku n’ụbọchị iri na otu na February n’afọ 1994. Ọ gbara naanị afọ iri anọ na anọ oge ọ nwụrụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.