
Nze na Ọzọ bụ echichi malitere n’obi Eze Nri, were gbasaa ebe niile Nri nwere aka na ya, nakwa obodo niile kwenyere n’ọchịchị, ndụ na ọdịnaala Eze Nri. Ọzọ bụ ehimehi, ya bụ otu, nze abụrụ onye e chibanyere na ya bụ ọzọ.
Na Bekee, e were ọzọ dịka ‘the institution,’ nze abụrụ ‘the Lords or Noble Member.’ Nze na Ọzọ so na ngalaba ọdịnaala Nri, bụrụkwa ngalaba omenaala Igbo. Ọ bụghị mpaghara Igbo niile nwere Ọzọ maọbụ na-echi ọzọ. Ndị Nze na-anọchite anya eze Nri na mpaghara Igbo niile were Nri dịka isimmiri ọdịnaala ala Igbo. Omenaala a kacha wee dịrị na mgbago ugwu na kwa n’ọdịda anyanwụ nke ala Igbo. Ndị mpaghara ndịda na ọwụwa anyanwụ ala Igbo na-eso usoro ọkọnkọ na otu ekpe.

Ndị nze nọ dịka ndị Bekee kpọrọ ‘Ambassadors.’ Ha bụ ndị ozi dị nsọ eze Nri nyere ikike n’obodo dị icheiche. N’ọdịnaala Nri, e kere ọrụ eke. E nwere ndị ọrụ ha bụ ijegharị obodo na mba dị icheiche maka ịkpụ arụ na nsọala, ya bụ, ikpochapụ ma dozie ihe ọjọọ ọbụla e mere megide ala. Ọrụ ndị Nze bụ ịhụ na ndị obodo na-eso omenaala ma na-edobe nsọala nakwa ikpezi esemokwu ọbụla dapụtara n’etiti ndị obodo. E ji aka ịdị ọcha, ikpe nkwụmọtọ na eziokwu wee mara ha. Ha bụ ndị nche ọdịnaala, nọdịkwa ka eze Nri a hụrụ anya.

E nwekwara ndị mgburichi, nke Olauda Equiano kọwara nke ọma n’akwụkwọ ya. Nke a bụ echichi dị iche ụfọdụ na-echi tupu ha chie ọzọ. {mụnwoke na ụmụnwaanyị na-egbu ịchị, mana ọ bụ sọ ụmụnwoke na-echi ọzọ. Ndị ọzọ a na-ahụkwa na ngwuru eze Nri bụ ndị dara akakpọ maọbụ ndị Aka (ya bụ dwarf/ Little person). A na-akpọ ha ‘aka Nri’ maka na a mụrụ ha n’obodo dị icheiche ma ha bịakọtara ọnụ biri na ngwuru eze Nri.
Ihe kpatara nke a bụ na ebe ha si were ha ka ndị nwere ọlụsị maọbụ ndị gbara iche bụ ọkara mmadụ na ọkara mmụọ. N’agụgụ ọdịnaala, kama a ga-egbu ha, a kpọga ha na ngwuru eze Nri ebe ha na-enye aka n’ọrụ ọdịnaala ma birikwa ndụ ha n’udo ruo na nka.

Onowu Ọraukwu.
Ị lezie anya, ị ga-ahụ na nze na ọzọ kacha dịrị n’Anambra na kwa n’akụkụ Imo, Enugwu nakwa Delta Steeti. Ebe ndị a bụ ebe ọchịchị ọdịnaala rutere ma dịkwa ire site na mgbe gboo wee ruo taa. Obodo dịgasị na mpaghara Ala Igbo ebe ndị a nwere ọkwa ndị ọzọ dị icheiche ha na-echi dịka ume, dunu, dim na eze.
Ọ dịkwa mkpa ịghọta na echimechi ọzọ na-efu nnukwu ego. A naghị agba aka echi ọzọ. Ị mefughị nnukwu ego, ị ga-egburiri Ehi. Nke a mere e ji etu ndị nze niile Ogbuehi. Ihe dịkarịchara mkpa bụ na naanị inwe akụnaụba ezughị mmadụ ichi ọzọ. Onye ahụ ga-enwe ezigbo agwa, bụrụ onye eziokwu nke onye ọbụla nwere ike ịgbara akaebe. Ọdịbendị ga-adị. Ọdịnaala ga-adị ebighịebi.
Nze Ike Anyanike
Ume-Nzeakọnobi.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

