Chike Obi

Chike Obi2

N’ụbọchị taa n’afọ 2008, ka Chike Obi zara oku ọnwụ. Na ndụ ya, ọ gụrụ ‘Mathematics’ na mahadum London. Ọ nwetara nzere “Ph.D” na Cambridge, Massachusetts. Nke a mere ya onye mbụ si Naịjirịa nwetara nzere ahụ. Obi lọtara ala anyị wee malite kụziwe na mahadum Ibadan, ma agha Biafra ekweghị ya nọtee aka ebe ahụ.

Mana tutu agha a malite, Chike so na ndị e wepụtara ka ha na-emebe iwu oge Naịjirịa nwerechara onwe ha n’aka mba Briten. E mekpara ya ahụ n’ọchịchị gọọmentị etiti dịka ibo ya ebubo na o so na ndị na-akpa nkata ịghasa ọchịchị onyekwuoucheya n’afọ 1962. N’ihi ya, ozigbo agha Biafra malitere, Obi dọnyeere Ojukwu ukwu ma, kwadosie ya ike na mbọ ka ndị ọwụwa anyanwụ nwere onwe ha.

Dịka onye nwere agụgụisi, ọ kwenyere na okwukwe ndị mmadụ na otu ha si ahụ na chi ha na-efe ka nke ndị ọzọ ike, tinyekwazịrị mgbachite ụfọdụ na-agbachitere agbụrụ ha, so ebute nkewa na nghọtahie n’ala anyị. Ka agha biri, ọ malitere nkụzi na mahadum dị na Legọs, ebe e mere ya Ọkammụta.

Chike mechara lọta ala nna ya bụ Ọnịcha, ebe o guzobere “Nanna Institute for Scientific Studies.” O nwetara ọtụtụ onyinye nkwanye ugwu maka mbọ ya na ngalaba “Mathematics.” Chineke ji ụmụ anọ wee gọzie ya na nwunye ya bụ Belinda. Chike Obi zara oku ọnwụ n’ụbọchị iri na atọ n’ọnwa Maachị, n’afọ 2008. Ala Igbo na ala Naịjirịa dum na-echeta odogwu a oge niile, maka nwata akwụkwọ ọbụla ụbụrụ ya na-anụ ọkụ na ‘maths’, a kpọwa ya Chike Obi.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.