Ọjị na Ndụ Ndị Igbo

Mkpụrụosisi a bụ ọjị bụ mkpụrụ a na-enyekarịsị ugwu n’ala Igbo. O nweghị onye nwere ike ịkọwa etu ọjị siri malite na ndụ ndị Igbo, ma onye Igbo ọbụla were ya dịka mkpụrụ osisi kacha ibe ya. E nwere ụdị ọjị abụọ– ọjị Igbo na ọjị Awụsa.

Ọjị Awụsa: nke a bụ ọjị na-agbakarị naanị abụọ. Ụdị ọjị a gbara ibe abụọ anaghị adịcha mma, ọ na-alọ alọ. E leghị anya ihe e ji akpọ ụdị ọjị a ‘ọjị Awụsa’ bụ na ọbụ ya ka ndị Awụsa na-atakarị. Ọ bụghị ndị Awụsa na-akọpụta ya; ndị na-akọpụta ya bụ ndị Yoruba. Ndị Igbo anaghị ejikebe ụdị ọjị a eme mmemme. Ọtụtụ ndị Igbo na-eleda ya anya.

Ọjị Igbo: Nke a bụ ọjị ndị Igbo na-atakarị. Ọ bụkwa nke a ka ha na-eji eme mmemme dị icheiche. A bịa n’ọjị Igbo, o nwere nke a na-akpọ ọjị ugo. E nyere ya aha nke a dịka etu o si acha. A na-akwanyekwara ya ugwu pụrụ iche dịka a ga-asị na ọ bụ ọjị ka ibe ya. Ihe e jikarị mara ọjị Igbo bụ na ọ na-agba ụbara ibe.

Ibe ole ọjị Igbo gbara nwekwara ihe ọ na-egosipụta. Iji maa atụ: ọjị gbara naanị otu ibe, ya bụ ọjị gbara gburugburu, abụghị ezigbo ọjị. A na-elegara ya anya dịka ọjị ogbi. A naghị ata ya ata. Ọjị gbara ibe abụọ, a naghị ewere ya dịka ezigbo ọjị. N’ebe ụfọdụ a na-akpọ ya ọjị nwaanyị. A na-eledakwa ya anya dịka e si eleda ọjị Awụsa. Ọjị gbara ibe atọ, a na-asị na ọ bụ ọjị Ikenga maọbụ ọjị dike.

Nke a pụtara na ọjị ịgba ibe atọ bụ ezigbo ihe na ndụ ndị Igbo. Ọ na-egosipụta na ihe kwuziri akwuzi. Ọjị gbara ibe anọ bụkwa ezigbo ọjị. A na-asị na ọjị dị etu a zuru ụbọchị ọnụ–Eke, Orie, Afọ na Nkwọ. Nke a na-egosipụta ihe ọma. Ọjị gbara ise maọbụ isii na-egosi na ihe ọma ga-abịara mmadụ. N’ebe ụfọdụ n’ala Igbo a na-ewere ya ka ọjị tụrụ aka ụba.

N’ebe ụfọdụ kwa a na-ewere ya ka ọjị tụrụ aka ọmụmụ. Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụ ọjị na-egosipụta na ihe ọma na-abịa. Ọjị gbaa asaa maọbụ karịa a na-ewe ya ka nnukwu ihe. N’ebe ụfọdụ onye wetara ọjị dị etu a na-ewere ya kechie were kwadebe nnukwu oriri maka ya. A na-egburu ya ọkụkọ. Onye aka dị arọ nwekwara ike gbuoro ya ewu. Nke a na-egosi na nnukwu ihe ọma ga-emere onye ahụ dịka nkwenye ndị Igbo siri dị.

Nke a si n’akwụkwọ Omenala na Ewumewu Igbo, nke C.C Ekwealọ dere.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.