
N’ụbọchị taa n’afọ 1938 ka a mụrụ Alex Anịmalụ. Ọ bụ onye Ọba, nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili South, L. G. A, Anambra Steeti. Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị na D. M. G. S, mechazịa gaa mahadum Ibadan.
Ebe a ka o ji nzere na “Maths” were pụta. Chike Obi sokwa bụrụ onye kuziiri ya na mahadum ahụ ọ gara. Ọ nwetakwara onyinye n’afọ 1961 na 1962, dịka nwaakwụkwọ kachaa mee ọfụma na ngalaba sayensị na mahadum ahụ.
Ọzọkwa, e nyere ya onyinye “Crowe’s Prize” tinyere ịgụ akwụkwọ n’efu. Ọ bụ onyinye ịgụ akwụkwọ efu a ka o ji gaa mahadum Cambridge na mba “United Kingdom” bido n’afọ 1962 ruo afọ 1965.
Ọ nọ mba “United Kingdom” na Amerịka ruo 1976, ebe ọ chọpụtara, ma dee akwụkwọ ụfọdụ na ngalaba ya dara ụda tutu ọ lọghachi Naịjirịa. E mekwara ya Ọkammụta na ngalaba “Physics” na mahadum Naịjirịa, Nsụka n’afọ 1976.
Ọ bụkwazi ya nyere gọọmenti ala anyị atụmatụ, e jiri guzo “Centre for Energy Research and Development” na mahadum Nsụka n’afọ 1980. Ọkammụta Anịmalụ azụọla ọtụtụ ụmụakwụkwọ na “Theoritical Physics” na “Solar Energy.” E mekwara ya “Emeritus Professor” nke mahadum Naịjirịa, Nsụka n’afọ 2006.
N’ezie, Ọkammụta Anịmalụ bụ oko osisi na ngalaba Sayensị, n’ala anyị na n’ụwa dum.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

