Philip Emeagwalị

"Philip n'onwe ya bidoro na nwata gosibe na ọ bụ ọkaibe, tụmadị na "Mathematics", maka ihe agwọ mụrụ aghaghị ịnwe ọdụ ogologo."

emeagwali gordon bell plaque cathedral hill hotel san francisco california february 28 1990 1
Philip na Onyinye Gordon Bell. Foto: emeagwali.com

N’ụbọchị taa n’afọ 1954 ka a mụrụ Phillip Emeagwalị n’Akure. Ọ bụ nwa mbụ n’ime itoolu nne na nna ya mụrụ. O tolitere n’Ọnịcha, nke dị n’Anambra Steeti. Nna ya makwa “Mathematics” nke ọma. N’ihi ya, ya na Chike Obi gara akwụkwọ otu oge.

james nnaemeka emeagwali circa 1970 onitsha nigeria father philip emeagwali
Nna Philip– James Emeagwalị. Foto: emeagwali.com

Philip n’onwe ya bidoro na nwata gosibe na ọ bụ ọkaibe, tụmadị na “Mathematics”, maka ihe agwọ mụrụ aghaghị ịnwe ọdụ ogologo. Nke a mere ndị klasị ya ji kpọwa ya “Calculus.” Mgbe ọ gbara afọ iri na anọ, Philip achịrịla “Maths” na mbọ aka ya, nke mere na ọka ndị nkuzi ya agbakọ, ewepụ.

james and philip emeagwali christmas day 1996
Philip na Nna ya. Ahụ igwe, ahụkwa ụzụ kpụrụ ya.
Foto: emeagwali.com

Mana nsogbu dara, nke b na nne na nna ya enweghị ike ịzụ ya na ụmụnne ya n’ụlọ akwụkwọ otu oge. Nke a mere Philip ji kwụsị ịga akwụkwọ. Ma ọdachi a emeghị ka ọ kwụsịzịa ịgụ akwụkwọ ya.

philip emeagwali 5 oguta road onitsha nigeria 1973
Philip dịka Nwa okorobịa n’Onịcha. Foto: emeagwali.com

Philip maara na ọ bụrụ na ọ zọghị onwe ya, azụ e ruo ya ala. Nke a mere na mgbe ọ dị afọ iri na asaa, o nwetara onyinye ịgụ akwụkwọ n’efu na mahadum Oregọnụ dị na mba Amerịka, ebe o ji nzere na “Mathematics” wee pụta.

Ọ mechara nwetakwa nzere “M. SC” abụọ. Otu na “Civil Engineering” ebe nke ọzọ bụ na “Marine Engineering.” Mahadum o si nweta nzere ndị a bụ na George Washington. Dịka onye nwere mmasị pụrụ iche n’akwụkwọ, ọ gakwara mahadum Michigan.

N’ebe a, ka odogwu a ji nzere “Ph. D” na “Scientific Computing” wee pụta. Mana ọ bụghị naanị sọ n’ịgụ akwụkwọ ka ike ọ kpara biri. Maka ọ bụ, a gụchaa akwụkwọ, a gụọ akara aka. Emeagwali si na nyocha otu aṅụ si eme omume, tụmadị na-ịmepụta mmanụ aṅụ, wee chepụta echiche o jiri wee rụọ kọmputa kacha eme ọsọ ọsọ n’afọ 1989.

E nyekwara ya onyinye nkwanye ugwu nke “Gordon Bell” maka nke a. Maka onye gbachaa egwu, o nweghị ihe o ritere, ọ dị ka onye agbaghị ọ kaa ya mma.

philip and dale emeagwali plaque cathedral hill hotel san franscisco california february 28 1990
Philip na Nwunye ya Ebe Ha Ji Asambodo Gordon Bell.
Foto: emeagwali.com

Ọ bụghị naanị ebe a ka ihe odogwu a mere n’elu ụwa a biri. Ọ wepụtakwara usoro nyeere mba Amerịka aka ịmị mmanụ ojii. Nke a kwụsịrị ntụfu ego karịrị nde otu narị dollars kwa afọ, nke a na-atụfubu na mbụ.

Ọzọ dịka ibe ya, ọ bụ kọmputa ọ mepụtara ka e ji agba afa ma ihu adị eluigwe mma, maọbụ na ọ  dịghị, tinyere, ma mmiri ọ ga-ezo, ka ọ gaghị ezo. N’ezie, ndị Igbo na-akpa ike.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.