
N’ụbọchị taa n’afọ 1954 ka a mụrụ Phillip Emeagwalị n’Akure. Ọ bụ nwa mbụ n’ime itoolu nne na nna ya mụrụ. O tolitere n’Ọnịcha, nke dị n’Anambra Steeti. Nna ya makwa “Mathematics” nke ọma. N’ihi ya, ya na Chike Obi gara akwụkwọ otu oge.

Philip n’onwe ya bidoro na nwata gosibe na ọ bụ ọkaibe, tụmadị na “Mathematics”, maka ihe agwọ mụrụ aghaghị ịnwe ọdụ ogologo. Nke a mere ndị klasị ya ji kpọwa ya “Calculus.” Mgbe ọ gbara afọ iri na anọ, Philip achịrịla “Maths” na mbọ aka ya, nke mere na ọka ndị nkuzi ya agbakọ, ewepụ.

Foto: emeagwali.com
Mana nsogbu dara, nke bụ na nne na nna ya enweghị ike ịzụ ya na ụmụnne ya n’ụlọ akwụkwọ otu oge. Nke a mere Philip ji kwụsị ịga akwụkwọ. Ma ọdachi a emeghị ka ọ kwụsịzịa ịgụ akwụkwọ ya.

Philip maara na ọ bụrụ na ọ zọghị onwe ya, azụ e ruo ya ala. Nke a mere na mgbe ọ dị afọ iri na asaa, o nwetara onyinye ịgụ akwụkwọ n’efu na mahadum Oregọnụ dị na mba Amerịka, ebe o ji nzere na “Mathematics” wee pụta.
Ọ mechara nwetakwa nzere “M. SC” abụọ. Otu na “Civil Engineering” ebe nke ọzọ bụ na “Marine Engineering.” Mahadum o si nweta nzere ndị a bụ na George Washington. Dịka onye nwere mmasị pụrụ iche n’akwụkwọ, ọ gakwara mahadum Michigan.
N’ebe a, ka odogwu a ji nzere “Ph. D” na “Scientific Computing” wee pụta. Mana ọ bụghị naanị sọ n’ịgụ akwụkwọ ka ike ọ kpara biri. Maka ọ bụ, a gụchaa akwụkwọ, a gụọ akara aka. Emeagwali si na nyocha otu aṅụ si eme omume, tụmadị na-ịmepụta mmanụ aṅụ, wee chepụta echiche o jiri wee rụọ kọmputa kacha eme ọsọ ọsọ n’afọ 1989.
E nyekwara ya onyinye nkwanye ugwu nke “Gordon Bell” maka nke a. Maka onye gbachaa egwu, o nweghị ihe o ritere, ọ dị ka onye agbaghị ọ kaa ya mma.

Foto: emeagwali.com
Ọ bụghị naanị ebe a ka ihe odogwu a mere n’elu ụwa a biri. Ọ wepụtakwara usoro nyeere mba Amerịka aka ịmị mmanụ ojii. Nke a kwụsịrị ntụfu ego karịrị nde otu narị dollars kwa afọ, nke a na-atụfubu na mbụ.
Ọzọ dịka ibe ya, ọ bụ kọmputa ọ mepụtara ka e ji agba afa ma ihu adị eluigwe mma, maọbụ na ọ dịghị, tinyere, ma mmiri ọ ga-ezo, ka ọ gaghị ezo. N’ezie, ndị Igbo na-akpa ike.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

