
Taa bụ ụbọchị ndị Igbo ji e cheta ọsọ ndụ ha gbara n’afọ 1993. Nke a bụ maka gọọmentị uwe kaakị, jụrụ ma jụbepụ isi, na ha agaghị akpọ rịzọtụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị a zọrọ n’afọ ahụ n’etiti Abiola na Tofa. Onyeisi ọchịchị mgbe ahụ bụ Babaginda.

O dokwara ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ M.K.O Abiola meriri na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ. Nke a kwesịrị ịme ka ndị ọchịchị nkịtị nara ndị uwe kakị ọchịchị, nke ga-eweta ọchịchị onye kwuo uche ya ọzọ eri Buhari pịnyụrụ ya n’aka Shagari, n’afọ 1983, wee bụrụ onyeisi ala.

Ihe mere ndị Igbo ji malite gbawa ọsọ aghara aghara, gbalatawa ala Igbo, bụ makana ha ahụsiri anya mgbe e gburu ha ka anụ ọhịa n’ugwu Awụsa n’afọ 1966; nke butezịrị agha Biafra. Ya mere ha ji sị ka ha kee nkwụcha, maka nkwụcha abụghị ụjọ. Ọzọ, onye ihe mere mbụ, mee ọzọ, bụ onye iberibe.
Obodo ndị Igbo kachaa gbaa ọsọ a bụ na Legọs. Ndị ọkwọ ụgbọala gaa Legọs, ha akwọrọ ndị Igbo kwọlata ala Igbo. Ụfọdụ na-akwụsị na Asaba, ebe ụfọdụ na-erutekwa Ọpa Iweka tutu ha ebugharịa ụgbọala ha lọghachi Legọs, gaa kwọlatakwa ndị ọzọ.
Ọ bụ n’etiti ihe ndị a na-ahịọ, ka e wepụtara mmiri ara ehi Cowebell, dị n’ime obere akwụkwọ. Nke a bụ mbụ e nwere mmiri ara ihe dị ọnụ ala na Naịjirịa. Erekwara ya naanị naịra ise n’oge ahụ. Nke a mere ka ụmụ mmadụ n’ezinụlọ ihe na-esiri ike, nwe ọghere ị zụrụ mmiri ara ehi ka ibe ha. N’ihi nke a, a gụrụ ya “milk Abiola.”

N’ezie, ụmụ Igbo ka ọgbaghara ọ bụla dara n’ala Naịjirịa, kacha emetụta. Ma n’ihe ndị a niile ha ka kwụ chị m, maka onye a jụrụ ajụ, anaghị ajụ onwe ya.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

