
Ụmụnna bụ ihe nwa bekee kpọrọ “kinsmen.” Nkọwa ụmụnna abụghị na otu nwoke kpọmkwem mụrụ ndị ahụ niile. Ọ bụghị naanị ụmụ Maazị Dike mụrụ maọbụ ụmụ naanị Maazi Okonkwọ mụrụ. O nwere ike ịbụ ụmụ ọtụtụ ụmụnwoke mụrụ ma ihe dị mkpa bụ na ha niile sitere n’ọtu nna nna gboo.
A kpọrọ ha ụmụnna n’ihi ha nwere otu ọbara. Nne ha abụghị otu nne, ha bụ ụmụnwaanyị e siri obodo dị iche iche lụọ. Nne ndị a nwere ike ha abụghị ndị Igbo. Nne ndị nke ọzọ nwere ike ha abụghịkwa ndị Igbo. Ebe nne ha siri bịa abụghị ihe a na-ekwu. Ihe a na-ekwu bụ na ha niile sitere n’agbụrụ otu nwoke.
Na mbụ, oge ndị ụka abịabeghi, ndị niile bụ ụmụnna nwere otu okpukperechi. Ha niile kweere n’otu chi. Ejirimara ọzọ banyere ụmụnna bụ na ha na-ebi n’otu ogige. Ụlọ ha dị nso ụlọ ibe ya. Ha na-ebiko ọnụ. Ihe ọzọ jikọrọ ha bụ na ha na-enwe otu aha e jiri mara ha. N’agbanyeghi na nna ha dị iche iche, ha na-enwe otu aha bụ ihe ụwa jiri mara ha. Aha a bụ aha onye mụrụ nna ha niile maọbụ aha otu n’ime ụmụnwoke mụrụ ha dum.
Ihe ịma atụ bụ
Ụmụ Dike
Ụmụ Okoro
Ụmụ Anyịam
Ụmụ Nkwọ
Ụmụ Aham
Ụmụ Eze
Ụmụ Agha
Ụmụ Agụ
Ụmụ Ọbasi
Ụmụ Okwe
Ụmụ Njọkụ

Ụfọdụ ụmụnna anaghị aza ụmụ. Ihe ha na-aza bụ ndị. “Ndị” na-asụsụ Igbo pụtara igwe mmadụ dika ụmụ pụtakwara igwe mmadụ.
Ịma atụ:
Ndị Uche
Ndị Onyema
Ndị Onwuka
Ndị Udoka
Ndị Ụzọka
Aha ụmụnna na-aza buru ibu. Ha na-enwe ọtụtụ ihe jikọrọ ha. Ọ bụ ụmụnna ole na ole na-emejupụta obodo. Ụfọdụ obodo bụ ụmụnna atọ mejupụtara ya. Obodo ndị ọzọ bụ ụmụnna ise maọbụ karịa, na emejuputa ya. N’obodo Ekenobizi nke ụmụọpara, ọ bụ ụmụnna ndị a mejupụtara ya:
Ụmụ Ụzam
Dike Ukwu
Dike Nta.
Azu Mmiri
Ọnụ Imo
Ụmụnna niile ahaghị aha. O nwere ụmụnna buru ibu, e nwekwara ụmụnna ebughị ibu. Ụmụnna, bụ naanị ụmụnwoke. Anaghị agunye ụmụnwaanyị n’ụmụnna. Ụmụnwoke ndị a bụkwa ndị torola eto, na-atụkwa ụtụ. Ndị rurula ihe e ji nwoke eme. Ụfọdụ ha bụ agadi nwoke, ebe ndị nke ọzọ bụ ụmụokorobịa. Ndị ka n’ọgụgụ n’ime ha alụọla nwunye mụta kwa nwa. Na nke ọma na nke ọjọọ, ọ bụ ụmụnna ka a na-akpọ. A hụ ụmụnna, a hụla ndị niile. Ọ bụrụ na a hụbeghị ha, a hụbeghị onye ọbụla.
Ụmụnna na-enwe nzukọ ugboro ole na ole n’ime afọ. E nweghị oge kpọmkwem a ga-asị na ọ bụ oge ha ji ezuko. Ọgbakọ ụmụnna na-adị mgbe ha chọrọ ka ọ dị. O nwere ndị na-eme ọgbakọ ha kwa izu ụka. Ndị ọzọ na-eme kwa ọnwa. A na-enwekwa ọgbakọ mberede iji hazie ihe dapụtara n’ike oge ahụ. N’ọtụtụ obodo a na-akụ ekwe mgbe a chọrọ ka ụmụnna zukọọ. Onye ọkụ ekwe ga-agagharị na-agwa ndị mmadụ na ha ga-ezuko mgbe dị otu a, n’oge dị otu a.
Ụmụnna abụghị naanị maka oriri na ọṅụṅụ. Ha nwere ọrụ ha na-arụ n’ezinaụlọ dị iche iche, nweekwa ọrụ ha na-arụ n’obodo n’uju. Otu ọrụ ha bụ ime ka udo dị n’obodo nakwa n’ezinaụlọ. Mgbe e nwere ọgbaaghara na esemokwu, ọ bụ ha na-edozi ya. N’ọtụtụ obodo dịka obodo nke m, ndị nwere esemokwu na-ebu ụzọ gaa na nke ụmụnna tupu ha agawa na nke ndị uweojii. Onye ọbụla ebughị ụzọ gwa ụmụnna anaghị aga n’ụlọ ndị uweojii. Onye bu ụzọ gaa na nke ha adaala iwu. Ụmụnna na-erikwa iwu. Iri mmadụ iwu bụ inara onye ahụ ego nke bekee kpọrọ “fine.”
Ụfọdụ ụmụnna na-ahụ ịga n’ụlọ ndị uweojii dịka ileli ha anya. Ha hụrụ onwe ha dịka ndị pụrụ ime ihe ndị uweojii pụkwara ime. Obi adịghị ụfọdụ ụmụnna ụtọ na uweojii na-eri ngarị. Uweojii ụfọdụ bụ ikpe mara eziokwu. Uweojii nara aka azụ, ha ama eziokwu ikpe.
Ọrụ ọzọ ụmụnna na-arụ n’ụfọdụ obodo dịka obodo m bụ ikere ndị mmadụ ala nna ha. Ọ bụrụ na nna ejighị aka ya kee ala ya mgbe ọ di ndụ, mgbe ọ nwụrụ, ụmụ ya nwere ike ikere onwe ha ala nna ha. Ọ bụrụ na ha ahụghị onwe ha n’anya nke na ha enweghị ike ike ala nna ha, ha ga-akpọ ụmụnna oku ka ha keere ha ala nna ha.
Ike ala nna mmadụ na-efu ihe. Ndị ụmụnna na-eritakwa ihe n’aka ndị ha bịara ikere ala nna ha. Ha na-anata ego, rie nri a kwọrọ aka sie, ṅụọ nmanya ụbọchị ha na-ekere ndị mmadụ ala nna ha. N’ọtụtụ obodo dịka obodo anyị, omenala obodo ekwuola ka a ga-esi eke ala. Omenala obodo enyela nwa ọbụla oke nke ruru ya. Ihe ụmụnna na-eme bụ isoro omenala kee ala. Ụmụnna na-achịkwa obodo ha. Ọ bụ ha na-eme iwu na-atakwa onye dara iwu ahụhụ. Mgbe ụfọdụ ka ha na-agbanwe iwu. Otu n’ime iwu ha na-eme bụ ikwupụta ihe na ego ole a ga-eji na-alụ nwaanyị n’obodo. Ụmụnna na-ekwu ihe a na-eme eme n’obodo na ihe a naghị eme eme n’obodo. Ntaramahụhụ a na-enye ndị dara iwu gụnyere iri ha iwu nke bu inara ha ego, ịmapụ mmadụ nke bụ ịgụpụ ya n’ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n’obodo ahụ, nke bụ na o nweghị onye ya na ya na-enwe mmeko ọzọ. Ihe ọma meere ya, o nweghị onye ga-abịa. Ihe ọjọọ dakwasị ya, ndị obodo agaghịkwa abịa.
Ọ bụ ụmụnna na-ahazi mmemme dịka ili ozu, ichi ọzọ, na mmemme dịka obodo si eme nke ha. Ọrụ ụmụnna agwubeghị. Ihe ha na-arụ abụghị otu, ọ bụghị abụọ. Ha na-edozi obodo. ha na-arụzi okporoụzọ. Ha ji mma na-asụ ahịhịa ruru n’akụkụ ụzọ. Ha na-agwọcha mmiri dị n’obodo ka mmiri ahụ dị ọcha dịkwa mma ọṅụṅụ. Ụmụnna na-eche nche n’obodo. Mgbe ọbụla ohi na-ezu n’obodo, ha na-amụ anya abalị na-eche nche. Mgbe ụfọdụ ha na-ejide ndị ohi.
Mgbe a na-alụ agha oge gboo, o bu ụmụnna na-alụso obodo ndị ọzọ agha. Ụmụnna adịghị ike maọbụ ndị nke ebughị ibu nwere ike ịga mba ọzọ kpọta ndị ga-alụrụ ha agha. Dịka ndị nchekwa nke ọdịnala, ụmụnna na-ahụ maka otu dị n’ime obodo. Ụmụnna na-ahụ onwe ha n’anya nke ukwu. Ha anaghị alụ onwe ha dịka dị na nwunye.
Nchikọta okwu m bụ na onye ọbụla kwesịrị isoro n’ihe ụmụnna ya na-eme. Anọla umunna gị ebe dị anya.
Odee: Iwuọha Prince
Ekwentị: +2348138460701
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

