
N’ụbọchị taa n’afọ 1996 ka Chiọma Ajụnwa nwetara ọlaedo n’olimpiki na mba Atlanta, Amerịka.
Chiọma malitere egwuregwu na futubọọlụ. O sokwa ụmụnwaanyị Naịjirịa wee gaa zọọ iko mba ụwa n’afọ 1991, ma egwu erughị ya na bọọlụ niile ndị otu ya gbara. Nke a mere o ji banye ngalaba “track and field” ebe ọ gbadoro ụkwụ na “long jump” tinyere ọsọ “100 metres.”
Mana uche nwaada a ka wee dị n’ọsọ “100 metres.” Nke mere na mgbe o ruru Atlanta maka olimpiki, ọ maghị na e tinyere aha ya na “long jump.” Na “100 metres” Chiọma ruru na “semi-finals” ebe ọkụ ya nyụrụ. O wee fọdụzịa “long jump.”
N’ezie, Chiọma enweghị olileanya na ọ ga-eme nke ọma na nke a, tụmadị ebe ọ kwadoghị nke ọma dịka ibe ya. Mana ọ maghị na ụzọ nwaanyị, abụghị ụzọ nwa. Oge ọ malitere, o woro onye ọbụla anya na o nwere onyinye pụrụ iche.
Elu nke mbụ ọ wụrụ na nke egbe buru ọ laa wee nweta akara “7.12m”, tụrụ ndị ọzọ ya na ya so n’ asọmpi ahụ ụjọ nke ukwuu, maka na nwoke na ibe ya ha bụ n’ọnụ. Ọ bụ e ruo n’omume, a mara mbe abụọ nke bụ oke. O nwekwaghị onye ruru akara ahụ ọzọ n’ụbọchị ahụ, tinyere Chiọma n’onwe ya.
Nke a mere Chiọma ji bụrụ onye Naịjirịa mbụ nwetara onyinye ọlaedo n’olimpiki, ma bụrụkwa onye Afrịka mbụ nwetara ya na ngalaba “Track and field.”
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

