Ncheta Power Mike

20200808 063216

N’ụbọchị taa n’afọ 1939 ka a mụrụ Micheal Ọkpara. Ọ bụ onye Neni, nke dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha, Anambra Steeti. Ọ malitere akwụkwọ na praịmarị skul nd Anglịkan dị na Adazi-Enu.

Ebe a ka ọ bidoro gosibe mmasị n’egwuregwu, maka ọkụkọ ga-abụ oke n’ebido n’eju. Ka ọ gụchara praịmarị skul, ọ gara ịmụ ahịa n’Ọnịcha, ebe o sikwa tinye isi na Kano, malite mụwa ahịa taya.

Ọ bụ na Kano ka ọ malitere ihe nkiri a gụrụ “Power Mike.” Ihe nkiri ndị a ọ na-eme adịghị mfe ma ọlị, maka na nwoke na ibe ya ha bụkwa n’ọnụ.

Ihe ndị a gụnyere iji aka nkịtị gbagọọ ntu toro ogologo, ibuli dimkpa nwoke anọ elu, iji aka nkịtị tiwaa akụ oyibo, wdg. O si na nke a wee malite mgba.

Ọ gbara mgba ma n’ala anyị, ma n’obodo ụfọdụ n’Afrịka, ya na mba ofesi. Ka ike gwụbara ya, ọ malitere kwalitebe mgba n’ala Naịjirịa. N’ihi nke a, ọ kpọtara ọtụtụ ndị aha ha na-ada ụda n’ụwa na mgba n’ala Naịjirịa, dịka Mighty Igor, Micheal Hayes, wdg.

Power Mike lara ezumike nka n’afọ 1976, maka ihe nwere mbido, nwere ngwụsị. Ọnwụ kpọrọ ya oku, nke ọ zara n’ụbọchị iri na otu, n’ọnwa Maachị, n’afọ 2004. Ndị Neni echezọbeghịkwa ike ọ kpara, nke mere e ji wee kpụọ oyiyi ya n’obodo ha.

IMG 20200806 104428
Oyiyi Power Mike na Neni.
Foto: Osita Amakeze.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.