N’ụbọchị taa n’afọ 1932 ka a mụrụ Christopher Ọkigbo. Na ndụ ya, ọ bụ onye Ojoto nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili South, Anambra Steeti. Nna ya bụkwa onyenkuzi n’ụlọakwụkwọ ndị ụka Katọlik.
N’agbanyeghị na nna ya bụ onye ụka, nke a emeghị ka Christopher kwụsị ịhụ omenala Igbo n’anya. O kwukwara hoo haa, na ọ lọọrọ nne ya ochie ụwa. Chris gara akwụkwọ na Gọọmenti Kọlegi Ụmụahịa, mechazịa gaa mahadum dị n’Ịbadan.
N’ebe a ka ọ gbanwere ịgụ maka ịbụ dọkịta, gụwa “Classics.” Oge ọ pụtara mahadum n’afọ 1956, ọ rụrụ ọrụ n’ọtụtụ ụlọọrụ tutu o nweta ọrụ n’ọbaakwụkwọ nke mahadum Nsụka. Ọ bụ ebe a, ka ọ malitere gosiwe na akwụkwọ ọ gụrụ abụghị n’efu, mgbe ọ dewere abụ, maka n’ihe a mụrụ amụ ka ihe a gwọrọ, agwọ.
O si Nsụka gaa Ibadan mgbe ọ nwetara ọrụ na “Cambridge University Press.” Ọ bụ ebe a ka ọ malitere bipụtawa ụfọdụ akwụkwọ dara ụda. Ka agha Biafra malitere n’afọ 1966, Chris gbara ụkwụ n’ala Igbo ozigbo, ma banye amị Biafra, maka ọ ma nke ọma na onye ụjọ anaghị azọtanwu ihe ọ bụla.
Ma ihe mberede dapidoro ya mgbe ndị soja Naịjirịa batara Nsụka, bụ ebe ọ nọ mgbe a na-alụ agha. Ọ bụ ebe a, ka ọkụ odogwu a nyụrụ. Ọnwụ ya wutere ụmụ Igbo nke ukwu, mana onye ọbụla kasiri onwe ya obi, maka, e mere elu, e mere ala, ọnwụ bụ ụgwọ mmadụ dum ga-akwụ.
Ihe mwute ọzọ bụ na ọtụtụ akwụkwọ ọ dere dị n’ụlọ ya n’Enugwu, bụ ndị e bipụtabeghị ebipụta gbara ọkụ oge agha Biafra rutere Enugwu. N’agbanyeghị ọdachi a, ọ bụghị akwụkwọ dum o dere, ọ na-ebipụteghị gbara ọkụ. O nwere ndị pụtara ihe mgbe agha biri, nwekwa ndị nwa ya nwaanyị bụ Ọbịageli ji.
Maka otu ọ bụla o si dị, onye gbara egwu ga-enwerịrị ihe a ga-egosi ọ gbatara n’egwu.
Daalụ nnụ.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.



