Ncheta Igwe Dọktọ Walter Eze.

"Ya mere o ji gawara Toronto, Canada, ebe ọ gụrụ ma nara ọzụzụ ịbụ Dọktọ bido n'afọ 1949. Ọ lọghachiri Naịjirịa dịka Kaptịn na "Canadian Military, Medical Corps, Unit" n'afọ 1957. Nke a mere ya onye mbụ bụ Dọktọ na soja ndị Naịjirịa."
20200903 182900

N’ụbọchị taa n’afọ 1991 ka Walter Eze zara oku ọnwụ. Na ndụ ya, a mrụ Walter n’ụbọchị iri na atọ n’ọnwa Nọvemba, n’afọ 1925. Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị na DMGS, Ọnịcha. Ebe a ka o si gaa “Yaba Higher College” wee nweta nzere n’ihe ọmụmụ Agriculture. Ọ gakwara n’ihu nwetakwa nzere ‘M. SC’ na mahadum Ibadan n’otu ngalaba “Agriculture” ahụ.

Ma nzere a e nyeghị ya afọ ojuju. Ya mere o ji gawara Toronto, Canada, ebe ọ gụrụ ma nara ọzụzụ ịbụ Dọktọ bido n’afọ 1949. Ọ lọghachiri Naịjirịa dịka Kaptịn na “Canadian Military, Medical Corps, Unit” n’afọ 1957. Nke a mere ya onye mbụ bụ Dọktọ na soja ndị Naịjirịa.

20200903 182927

Ọ lụrụ nwunye ya bụ Justina n’afọ 1958, maka ihe nwoke ruru ogo ya abụghị ụsa. Chineke jikwa ụmụ anọ- otu nwaanyị na nwoke atọ wee chọọ ha mma. Ọ rụkwara ọrụ n’ụlọọgwụ ọha nke dị n’Enugu, Oji Riva na Ọnịcha tupu ọ meghee ụlọọgwụ nke ewu n’ọkụkọ mara n’Ọnịcha ọ gụrụ Toronto.

Ụlọọgwụ a bidoro n’obere ụlọ dị na “Court Road” tupu ọ bụrụ agadaga nnukwu ụlọ elu nke onye ọbụla ma ugbu a. A makwa Walter dịka onye na-emere ndị ejighị ego ebere n’ụlọọgwụ ya. Ụfọdụ ndị ọrịa sokwazị ya ala n’ụlọ ya. Kama iwe ga-ewe ya, o were obi ebere nyochapụta ihe na-eme ha, ma nye ha ọgwụgwọ.

Walter bụkwa onye na-ejighị ofufe Chineke egwuri egwu, dịka nna ya bụ Igwe Micheal Anekwe si kụziere ya. N’agbanyeghị na nna ya bụ eze obodo ha, ọ kwụsịrị ofufe omenala n’ụlọ ya, ma were onwe ya nyefee Chineke bido mgbe ọ dị naanị afọ iri na iteghete.

Ọ bụ maka ntọnala a ka Walter ji were obi ya niile kwado ọtụtụ ihe a rụrụ n’ụlọụka nke “Diocese on the Niger.” N’obodo ya bụ Ukpo, Walter so na-enyere nna ya bụ eze obodo aka n’ọchịchị. Nke a mere ozigbo nna ya kwuru na ọ ga-anọchi anya ya, a malite kpọwa ya Eze n’Ukpo.

Dịka “President General” ndị Ukpo, Walter n’isi onwe ya wetara ọkụ latriki, ụzọ, ahịa, ụlọakwụkwọ, mmiri ọṅụṅụ na ihe ndị ọzọ mere ka obodo ya mepee emepe. Ọ nọdebere nna ya nso nke ọma, iji mata omenaala tinyere ihe ndị ọzọ o kwesịrị ị maa, maka ọ bụ nwata na-asọghị isi eze okenye, na-enweta amamihe.

Ka nna ya nwụrụ, e mere ya Eze n’ụbọchị iri abụọ na otu, nke ọnwa Disemba, n’afọ 1984. Ọ bụ ezie na ọchịchị ya bụ naanị afọ asaa tutu ọ nwụọ, ndị Ukpo echezọbeghị ya ruo taa. Nke a bụ maka ọ na-aga akwamozu onye ọbụla nwụrụ, tinyere ịleta ndị ọrịa n’ụlọ ha.

N’ezie, ndụ Walter Eze bụ ihe ndị ọchịchị ọdịnala ugbua tinyere ndị Dọkịta kwesịrị ịṅomi.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.