Sir Kevin Chukwumobi(APAMS)

IMG 20200922 WA0001

Ekwe a na-akụrụ nwoke bụ maka ihe ọ mere na ndụ ya. A mụrụ Kevin n’afọ 1970. Ọ bụ onye Ukpọr nke dị na Nnewi South L. G. A, Anambra Steeti.

Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị na Immaculate Conception Seminary dị n’Ụmụahịa. Ebe a ka o si gaa Fed. Poly Oko, wee gụọ Mass Communication.

Sir Kevin banyere ahịa ọgwụ ka ọ gụchara akwụkwọ. Ọ gụrụ ahịa ya APAMS, nke pụtara Amuche Pharmaceuticals and Medical Services. Ka ọ gara Don’s Funeral Home na mba Amerịka ka o nwere mmasị ị banye ahịa ili ozu, ma kwanyere ya ugwu kwesịrị.

N’agbanyeghị ụfọdụ ọdachi ọ gabigara, o jisiri ike gbado anya ma mee APAMS FUNERAL SERVICES ihe ọ bụ taa. Nke a pụtara na o nweghị ụdịrị ihe ha ejighị ebu ozu taa.

Site n’ọgbatumtum na ụgbọala dị ọnụ, ịnyịnya, ruo ụgbọelu(helicopter), ha na-eji ha niile dum. N’ezie, APAMS enweghị oyiri. Ha malite ihe, ndị ọzọ a na-esonye.

N’ihi nke a ha bụ ndị hụrụ maka ozu ndị a:

  1. Dim Chukwuemeka Ojukwu
  2. Prof. Dora Akụnyịlị
  3. Senator Chukwumerije
  4. Chinua Achebe, wdg.

Ọ bụkwaghị naanị sọ ndị nnukwu mmadụ ka Sir Kevin na-eli ozu ha. Ụfọdụ oge, ọ na-enyekwa aka eli ndị enweghị ka ọ haa ha. Sir Kevin enwetakwala onyinye kwanyere ugwu ole na ole, maka mbọ ya n’elu ụwa a. Ọ lụọla nwaanyị, maa mụta ụmụ.

Ekpere anyị bụ dị ka ọ na-echeta ụbọchị ọmụmụ ya taa, ka ogologo ndụ na ahụike bara ya ụba. Ya gazie.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.