Ncheta Emmanuel Arinze Ifeajụna

N'ụbọchị taa n'afọ 1967 ka Ifeajụna zara oku ọnwụ site n'ọnụ egbe ndị soja Biafra. Na ndụ ya, a mụrụ ya n'afọ 1935. Ọ bụkwa onye Ọnịcha nke dị n'Anambra Steeti. Ọ gara akwụkwọ na DMGS, ebe ọ malitere gosiwe onyinye pụrụ iche n'egwuregwu "Athletics."
Emma Ifeajuna e1436207117589 768x527 1

N’ụbọchị taa n’afọ 1967 ka Ifeajụna zara oku ọnwụ site n’ọnụ egbe ndị soja Biafra. Na ndụ ya, a mụrụ ya n’afọ 1935. Ọ bụkwa onye Ọnịcha nke dị n’Anambra Steeti. Ọ gara akwụkwọ na DMGS, ebe ọ malitere gosiwe onyinye pụrụ iche n’egwuregwu “Athletics.”

N’afọ 1954 ka o so na ndị gara nọchite anya ala Naịjirịa n’egwuregwu “Commonwealth” na Vancouver dị na mba Kanada. N’agbanyeghị na o yi otu akpụkpọụkwụ n’ụkwụ akaekpe ya, nke a egbochighị ya bụ onye nke mbụ n’egwuregwu “high jump.”

Nigerian high jumper Emmanuel Ifeajuna on a boat cruise in Vancouver e1494071509799

Nke a mere ya onye ojii mbụ n’Afrịka dum nwetara onyinye ọlaedo n’ihe gbasara egwuregwu. Ka o si njem a lọta, ọ kwụsịrị isonye n’egwuregwu ahụ na ndụ ya mana nke a emeghị ka e chezọzịa ihe ọ mere. N’ihi ya, e ji ihu ya were bipụta akwụkwọ e ji ede ihe bido mgbe ahụ.

Vancouver 400x507 1

Ọ bara mahadum Ibadan ebe ọ malitere akwụkwọ na ngalaba Sayensị. N’ebe a ka ọ nọ zutekwa Chris Ọkigbo. Ha abụọ wee bụrụ ezigbo enyi. Na mgbe ahụ ka ọ hụkwara ma lụọ nwunye ya bụ Rose. Ha mụtakwara ụmụ nwoke abụọ.

Ka ọ gụchara akwụkwọ, ọ malitere nkuzi n’ụlọakwụkwọ Ebenezer Grammar School dị n’Abeokuta. Ma nke a enyeghị ya afọ ojuju. Ọ bụ ya mere o ji banye amị. Dịka onye gara akwụkwọ, o gbughị ya oge ịrịgo n’ọkwa wee ruo ọkwa majọ.

Mwute ọ nwere n’otu ndị ọchịchị nkịtị si achị Naịjirịa mere o ji sonye na nkata nke butere ọnwụ ụfọdụ ndị nnukwu mmadụ dịka Ahmadu Bello na Tafawa Balewa. Okwu na ụka dapụtakwara na nke a, nke mere o ji rie mbombọ ọsọ gbagaa Ghana, site n’enyemaka Chris Ọkigbo.

Ka agha Biafra malitere, o sonyere ndị Biafra. Mana dịka akụkọ si kọọ, ozigbo ọ chọpụtara na agha ahụ dị ka mmadụ ịgba aka were nwude ihe na-ata arụ, ya na ụfọdụ ndị soja welitere isi n’ọkwa chọbara ụzọ ịkwụsị agha Biafra.

Ozigbo Ojukwu bụ onyeisiala Biafra matara nke a, a nwụụrụ ha, kpee ha ikpe nke e kwubiri na ọnwụ bụ ụgwọ ihe ha mere. A gbagbukwara ya na ndị otu ya n’ụbọchị taa, n’afọ 1967.

Nke kakwa njọ bụ na ndị soja Naịjirịa wakporo Enugu ka ụbọchị abụọ gasịrị ma gbuo ọtụtụ ụmụ Igbo. Ihe ndị a mere Ifeajụna na ndị otu ya, ha dịzịa ka ndị amụma.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.