
N’ụbọchị taa n’afọ 2014 ka Amaka Igwe zara oku ọnwụ. Na ndụ ya, Amaka gara mahadum Obafemi Awolowo, Ife, ebe ọ gụrụ “Education/Religion” ma nwetakwa nzere “M. SC” na mahadum Ibadan. Ọ lụrụ di n’afọ 1993 ma mụtakwa ụmụ atọ.
Amaka gosiri ihe o ji bụrụ ọkaibe n’ihe nkiri homu vidio, oge ọ mepụtara ihe nkiri ndị a:
Checkmate
Fuji House of Commotion.
Violated.
Rattle Snake, wdg.
Obi gbawara ụmụ Igbo, ezinaụlọ ya na ndị enyi ya, mgbe ọ nwụrụ. Mana mmadụ dum ji ihe ọ mepụtara na ndụ ya wee die ọnwụ ya. Maka n’ihe niile naanị ọrụ anyị ka a ga-eji cheta anyị.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

