Ncheta Dọkịta Nnamdị Azikiwe

Zik
zik 2

N’ụbọchị taa n’afọ 1996 ka Dọkịta Nnamdị Azikiwe zara oku ọnwụ.

Na ndụ ya, ọ bụ nwa amaala Igbo a maara nke ọma na Naịjirịa gbaa gburugburu ya na mba Afrịka. A mụrụ Zik ka ọnwa Nọvemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na isii n’afọ 1904 na Zungeru, Naịja steeti nke dị n’Ugwu Awụsa. Nna ya bụ odeakwụkwọ n’ụlọọrụ Lord Lugard n’oge ahụ.

Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na “C.M.S. Central school,” Ọnịcha, gụkwaa akwụkwọ sekọndịrị na “Hope Waddel Institute”, Kalaba, ya na “Methodist Boys’ High School,” Legọs. O mechara gaa ala Bekee gụọ akwụkwọ na mahadum Lincoln ebe o nwetere nzere B.A n’ihe ọmụmụ Political Science n’afọ 1930. Ọ gụkwara na mahadum Columbia ebe ọ mụrụ maka Jonalizim.

O nwekwara mmụta na “Religion na Philosophy.” Na mba Amerịka, Zik rụrụ ọrụ isacha efere, igwu koolụ, isa moto, ibecha nduku, iti ọkpọ, na ọrụ ndị ọzọ iji nweta ego o ji azụ onwe ya n’ụlọakwụkwọ.

Obibi Zik biri na mpaghara Naịjirịa dị iche iche mere ka ọ na-asụ asụsụ atọ a kacha mara na Naịjirịa- Igbo, Awụsa na Yoruba. Zik kụziri nkụzi na Mahadum Lincoln malite n’afọ 1934. Ọ bụ n’afọ 1934 ka ọ laghachiri Ọdịda Anyanwụ Afrịka, wee malite ọrụ nta akụkọ n’obodo Accra dị na Gold Coast nke a na-akpọ Gana ugbua.

Ọ bụ odeakwụkwọ nke akwụkwọ akk a na-akpọ “Morning Post.” O ruo n’afọ 1937, ọ laghachi na Naịjirịa, malite ibipụta akwụkwọ akụkọ a na-akpọ “West African Pilot.” Ihe mbụ o mere metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo bụ ibanye otu a na-akpọ “Nigerian Youth Movement,” mgbe Herbert Macaulay malitere otu a na-akpọ N.C.N.C (National Council of Nigeria and Cameroun).

Zik bụ nnukwu odeakwụkwọ a n’afọ 1944. Mgbe Herbert Macaulay nwụchara, Zik nọchiri anya ya dị ka onyeisi otu N.C.N.C. Ọ gbasiri mbọ ike hụ na Naịjirịa si n’aka ndị Briten na-achị ya na mbụ nwere onwe ya n’Ọktoba 1960. Ọ bụ ya bụ nwaafọ Igbo mbụ bụ Governor General nke Naịjirịa.

Mgbe Naịjirịa nwetara Republic n’afọ 1963, Zik bụ Prezidentị mbụ nke Naịjirịa. Ọ gbasiri mbọ ike ma kwusie ike ka ndị Bekee hapụ mba dị iche iche n’Afrịka ka ha nwere ma chiwakwa onwe ha. Nke a mere e ji akpọ ya “Zik of Afrịka.” O hibere Mahadum Naịjirịa, Nsụka.

Ihe ụfọdụ e ji echeta Zik maka ezigbo ọrụ ọ rụrụ n’ala anyị bụ Naịjirịa bụ ndị a:

(a) Isi ya ka e sepụtara n’akwụkwọ ego narị naịra ise (N500).

N500 1

(b) Aha ya ka e jiri guzobe Mahadum n’Ọka.

unizik

(ch) E jiri aha ya wụọ “Nnamdị Azikiwe International Airport, Abuja.”

Zik Airport

Zik nwụrụ ka ọnwa Mee dị na mkpụrụ ụbọchị iri na otu n’afọ 1996 ka ọ rịatụrụ ahụ obere oge na “University of Nigeria Teaching Hospital,” Enugwu. E liri ya ka ọnwa Nọvemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na isii na be ya n’Ọnịcha, Anambra Steeti, n’afọ 1996.  


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.