Ncheta Akanụ Ịbịam

"Akanụ Ịbịam jụrụ aha Bekee ya bụ Francis ma weghachikwara ndị ọcha echichi “Knight” ha chiri ya, n’ịgba iwe maka nkwado ọchịchị mba Britain nyere ọchịchị etiti ala Naịjirịa n’igbusisi ụmụmmadụ n’oge Bịafra."
akanu ibiam

N’ụbọchị taa n’afọ 1995 ka Akanụ Ịbịam zara oku ọnwụ. Na ndụ ya, Akanụ Ịbịam bụ onye Ụnwana nke dị n’Afịkpo na steeti Ebọnyị. A mụrụ ya n’ọnwa Nọvemba n’afọ 1906. Nwunye ya bụ Olainka Ịbịam. Ha mụrụ ụmụ anọ.  Akanụ Ịbịam gụrụ akwụkwọ na “Hope Waddel Training Institute Calabar”, na “Kings College, Lagos.” O mechaara gaa Mahadum nke “St. Andrews” na mba Scotland. Ebe a ka o nwetara nzere mmụta dịka dibịa Bekee n’afọ 1934.

          E mechaara nabata ya dịka dibịa Bekee nke ndị ụka Scotland. Nke a nyeere ya aka ịgba mbọ maka iwube ụlọọgwụ n’Abịrịba, Itu na Ụbụrụ. N’ihi mbọ niile ọ gbara na ọrụ ọma ọ rụrụ dị ka dibịa Bekee nke ndị ụka Scotland, e chiri ya echichi “Knight” n’afọ 1951. Site n’afọ 1955 were ruo n’afọ 1958, ọ bụ onyeisi Kansul ndị ụka Kraịst na Naịjirịa dum.

          Mgbe ala anyị Naịjirịa malitere chịwa onwe ya n’afọ 1960, e mere ya gọvanọ nke Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Ọ nọgidere n’ọkwa a ruo n’afọ 1966 mgbe ndị agha Naịjirịa weghaara ọchịchị.

          Mgbe Emeka Odumegwu Ojukwu mechara bụrụ Onyeisi n’oge Bịafra, Akanụ Ịbịam nyere nnukwu aka iwebata ihe oriri na ọgwụ enyemaka site n’aka ndị ụka “World Council of Churches” nke Akanụ Ịbịam bụ otu onye na ndịisi.

          Akanụ Ịbịam jụrụ aha Bekee ya bụ Francis ma weghachikwara ndị ọcha echichi “Knight” ha chiri ya, n’ịgba iwe maka nkwado ọchịchị mba Britain nyere ọchịchị etiti ala Naịjirịa n’igbusisi ụmụmmadụ n’oge Bịafra.

          Ndị obodo ha bụ Unwana eburularị ụzọ chie ya “Eze Ogo Isiala nke mbụ n’Ụnwana” na “Osuji nke Ụbụrụ”. Eze Ogo Akanụ Ịbịam nwụrụ n’ọnwa December n’afọ 1995.

          N’ihi ọrụ ọma niile ọ rụrụ, e wubere ihe ụfọdụ maka ncheta aha onye ọma a. Ha gụnyere “Akanụ Ịbịam International Airport, Enugu” na “Akanụ Ịbịam Federal Polythecnic, Ụnwana, Afikpo”.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.