Ezinaụlọ Iri Atọ N’Anambra Steeti A ma Ama.

anambra map

Akụkọ Anambra Steeti jupụtara na mbọ ụfọdụ mmadụ gbara, nke ọrụ ha rụrụ dakwara ụda. Nke a nyere ezinaụlọ ha ugwu ma mee ka ha bụrụ ọkaibe bụrụkwa ndị a ma ama, n’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ha anọghịzi ndụ.

Ọmụmaamtụ ezinaụlọ ndị a bụ:

  1. Iweka: aha nna a so na nke a kacha aza n’ala Naịjirịa. Na nchọpụta e mere, a dị mmadụ 1472 na-aza ya. Agbụrụ Iweka enwela ọtụtụ eze n’Obosi. Aha a na ugwu so ya gafere ala Obosi tinyere obodo ndị ọzọ gbara ya gburu gburu. Okporoụzọ Iweka na ụzọ Iweka ebe a na-azụ ahịa elektrọniks nke dị n’Ọnịcha nwetara aha ha n’ezinaụlọ a.

1 Bridge Head Upper Iweka 1170x694 1
Upper Iweka

Ọzọ, ọ bụkwa n’ezinaụlọ a ka Isaac Emenike Iweka si. Nwoke a bụ njinịa mbụ bụ onye Igbo n’ala Naịjirịa.

  • Onyịuke: ezinaụlọ Onyịuke si Nimo nke dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke Anambra Steeti. Malite na nna ha ukwu bụ GCM Onyịuke, nke bụkwa SAN, ha enweela okwuluora karịrị mmadụ iri abụọ. Nke a pụtara na ha chị ihe gbasara ikpe na mbọ aka.

Ọkammụta Ndi Okereke-Onyiuke nke gbanwere “Nigerian Stock Exchange” dịka onyeisi sikwa n’ezinaụlọ a.

  • Ikpeazụ: Ikpeazụ nke Ọnịcha bụ aha nna kara aka. Nke a sitere n’ike Hon. Justice Chụba Ikpeazụ kpara mgbe ọ bụ “Chief Justice Nigeria.” Chụba mechara bụrụkwa onyeisi “Nigerian Football Association.” Ezinaụlọ a n’oge ugbua, enweekwala ọkaikpe pụrụ iche nke bụ Onyechi Ikpeazụ, tinyekwara ụfọdụ ọkaikpe ndị ọzọ. Ndị be Ikpeazụ bụ ndị a na-akwanyere ugwu n’Ọnịcha.
Chuba IKPEAZU 2
Chuba Ikpeazu

  • Modebe: aha nna a bụkwa aha ọzọ a maara nke ọma. Site na nnyocha, e nwere mmadụ ruru narị iri isii na-aza aha a. Otu ụlọakwụkwọ tinyere otu ụzọ na-aza aha a n’Ọnịcha. Aha nna ha ukwu bụ Joseph Fredric Modebe. Okporoụzọ Modebe nke a ma dịka “Modebe Avenue” na ụfọdụ ụzọ dị ya nso bụ ha nwe ya tutu a malite resịwa ya ndị mbịa mbịa. Nke a bụ mgbe ahịa malitere gawa nke ọma n’Ọnịcha.
  • Eze: Eze n’Ukpo so n’ezinaụlọ ọchịchị ọdịnala dị na be ha, a na-akwanyere ugwu n’Anambra Steeti. Ọ bụ n’ezinaụlọ a ka Dọktọ bekee mbụ bụ onye amị si wee pụta. Aha ya bụ Walter Eze. Ọ bụkwa na be ha ka Prince Engr. Arthur Eze nke nọ n’ahịa mmanụ ojii si pụta. Igwe ndị Ukpo ugbua sikwa na be ha. Nna nna ha bụ eze mbụ ndị Ukpo. Aha ya bụ Igwe Micheal Eze.
Arthur Eze
Arthur Eze
  • Nwachukwu: ezinaụlọ Nwachukwu n’Ụmụnya so n’ezinaụlọ a ma ama n’Anambra Steeti. Ha nwere Bishop atọ na be ha. Ha bụ Bishop Paul Nwachukwu, Bishop Arthur Nwachukwu na Bishop Paul Nwachukwu Jr. Paul Nwachukwu bụ onye hibere ụlọụka Grace of God, ebe Arthur hibere ụlọụka Rhema.
Bishop Paul Nwachukwu
Bishop Paul Nwachukwu

  • Amechi: ezinaụlọ a bụ nke Minista Aviation mbụ na Naịjirịa sitere na ya. Aha ya bụ Chiifu Mbazulike Amechi. Ezinaụlọ a nwekwara ndị mere nke ọma n’ịzụ ahịa tinyere ndị zọkwara ndọrọndọrọ ọchịchị. A na-enyekwa ha ugwu ruuru ha n’obodo ha bụ Ụkpọr. Chiifụ Mbazulike bụzi naanị onye dị ndụ n’ime ndị niile so gbaa mbọ ka Naịjirịa nwere onwe ya n’aka mba Briten ugbua. O nwekwara nghọta n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa maka ọ nọbu na ya na mbido.
Amaechi Mbazulike
Mbazulike Amaechi

  • Ụba: ezinaụlọ Ụba n’Isuọfịa bụkwa ndị a ma ama. Ọ bụ ụmụnne nwoke abụọ gbara mbọ maka ya. Ha nọ n’ahịa ibuga ngwa ahịa ebe ọbụla ndị rụrụ ya chọrọ ka ọ jee na Naịjirịa. Ugbua, ụmụ ha emeela ahịa ha nọ n’ime ya agbasaa. Ha nọkwasị na ahịa ala, ụlọ, mmanụ ojii, wdgz.
  • Nwankwụ: ezinaụlọ Nwankwụ n’Abagana buru ibu. Ihe mekwara aha ha ji wuwe bụ mbọ Sir Josef Nwankwụ gbara. Sir Joe so na ndị ọgaranya a ma ama n’Anambra oge gara aga. Ezinaụlọ a wepụtakwara agbara nwaanyị atọ bụ ọpụrụiche na Naịjirịa. Ha bụ Elizabeth Nwankwụ nke bụ district gọvanọ mbụ “Rotary Club.” Ọzọ bụ Amaka Nwankwụ, nwaanyị mbụ n’Anambra e mere “Managing Director” ụlọakụ. Nke ikpeazụ bụ Oby Nwodo onye bụkwazi ọkaikpe n’ụlọikpe mkpegharị.

  • Ume-Ezeoke: ọ bụghị naanị na ezinaụlọ a buru ibu n’obodo ha bụ Amichi. Nna nna ha bụ Umeorimili Ọjị Ezeoke bụkwa “warrant chief” n’afọ 1914. Ezinaụlọ a, e wepụtara ndị bụ “ambassadors”, ndị ọkaikpe na “Speaker” nke “Nigerian House of Representatives” oge gara aga bụ Chiifu Edwin Ume-Ezeoke.
  • Onyema: ndị a bụ ezinaụlọ ọchịchị ọdịnala obodo ha bụ Oguikpele dị na be ha. Ha nwere Wilfred Onyema nke gara “House of Representatives”, Oscar Onyema, nke bụ onyeisi Stock Exchange Nigeria” afọ iri, tinyere Margaret Onyema-Ọrakwụsị nke bụ nwaanyị nọ n’isi ndị na-atụ ahịa si ụgbọmmiri abata Naịjirịa.
Oscar Onyema
Oscar Onyema
Margaret Onyema
Margaret Onyema
  • Umeadị: ezinaụlọ a nwere ndị ọkaikpe n’uju. Philip Umeadị nke bụ “Senior Advocate Nigeria” oge ọ dị ndụ bụ onyeisi ezinaụlọ a. Ha enwekwala Chief Judge Anambra Steeti. Ọzọ, ha nwekwara Philip Umeadị nke rụrụ ọrụ “Commissioner Inec” mgbe gara aga.

  • Nwosu: Ezinaụlọ Nwosu na Nri bụ ezinaụlọ kwụ chịm a ma dịka ndị na-eme ọfụma n’ahịa ha na-azụ. Ọ bụ ha nwe “Njikọka Motors” na “Koka Oil.” Akụnaụba dị n’ezinaụlọ a eruola afọ iri isii.

  • Orizu: ọchịchị ọdịnala malitere n’ezinaụlọ Orizu na Nnewi site n’Igwe Orizu nke mbụ bụ, Eze Ụgbọnyamba. Ọ bụ n’ezinaụlọ a ka “Senate President of Nigeria” nke mbụ, bụ Ọjị Nwafọ Orizu, si wee pụta. Ọ bụkwa be ha ka eze ọchịchị ọdịnala nọrọla ogologo oge kachanụ n’ọchịchị na Naịjirịa bụ Kenneth Orizu sikwa. Ezinaụlọ a kpaala ike dị egwu nke mere e ji gbanwee aha “Anambra College of Education, Nsugbe ka  ọ bụrụzie “Nwafọ Orizu College of Education.
Obi of Otolo and Igwe of Nnewi Kenneth Orizu
Igwe Kenneth Orizu

  • FGN Okoye: FGN Okoye n’Enugwu Ukwu bụ odogwu hibere “business empire” nke ka na-emekwa ọfụma. Ha na-eme “business ndị a: “building na construction”, “printing”, “liquor distribution” na “TNT courier.” Ụmụ FGN sokwa ntọnala ya, na-emekwa ọfụma. Ha nwere Engineer, ọkaikpe ụlọikpe appeal na dọkịta bekee ama ama.

  • Ọnwụamaegbu: ezinaụlọ Ọnwụamaegbu bụ ndị a na-akwanyere ugwu n’obodo ha bụ Ọba. Ọkaikpe Ọbụmneme Ọnwụamaegbu bụ “Chief Judge” Anambra Steeti na “Attorney General” nke ọwụwa anyanwụ dum n’oge gara aga. Ha nwekwara nwaanyị mbụ e mere “Chief Judge” Anambra Steeti, bụ  Ijeabalụm Ọnwụamaegbu na Mejọ Generalụ Emeka Ọnwụamaegbu nke bụ “commandant” nke iri abụọ na ise na “Nigerian Defence Academy.”
Ijeabalum Onwuamaegbu
Ijeabalum Onwuamaegbu

  • Erinne: ezinaụlọ Erinne n’Ọkịja nwere ugwu pụrụ iche ma nweekwa ọtụtụ ọkaikpe. Ọ bụ na be ha ka nwaanyị mbụ bụ “Senior Advocate of Nigeria” si wee pụta.

  • Ekwueme: ezinaụlọ Ekwueme n’Oko, Anambra Steeti kwụ chị m tụmadị na ndọrọndọrọ ọchịchị. Ha enweela onye nnọchiteanya Prezidenti Naịjirịa bụ Alex Ekwueme ya na Ọkammụta Laz Ekwueme nke bụkwa eze ndị Oko ugbua, ma bụrụkwa ọkaibe dịka “Musicologist.”
alex ekwueme
Alex Ekwueme
laz ekwueme
Laz Ekwueme
  • Nwandụ: ezinaụlọ Nwandụ n’Enugwu Ukwu bụ ezinaụlọ a na-akwanyere ugwu ruuru ha. Ọ bụ ha nwe “Masters Holdings” na “Daniels Construction.” Ọtụtụ ndị be ha nọkwa n’ọrụ ọha (public service) ma na steeti ma na fedraal.
  • Ojukwu: ezinaụlọ a so na ndị a kacha akwanyere ugwu ma na Nnewi ma na Naịjirịa. Nna nna ha bụ Louis bụ ọgaranya mbụ kpatara ego ruru nde n’ọgụ n’Afrịka niile. Ọ bụkwa Prezidentị mbụ nke “Nigerian Stock Exchage.” Nwoke a bụ nna Emeka Ojukwu nke bụ onyeisi mba Biafra, bụrụkwa nna Josef Okwuabụdike Ojukwu nke bụ Ọkammụta na ngalaba dọkịta bekee.
Emeka Ojukwu

Emeka Ojukwu
  • Ọdụa: ọchịchị ọdịnala dị n’ezinaụlọ a. Ha bụ ndị Ọgbarụ. Ezinaụlọ a nwere ndị na-azụ ahịa, ndị ọchịchị ọdịnala na “Senator” na-anọchite anya ndị Anambra Nọọtụ ugbua bụ Stella Ọdụa.
Stella Oduah
Stella Oduah

  • Ọkigbo: ezinaụlọ Ọkigbo bụ ndị a ma ama n’Ojoto. Ụmụnne nwoke atọ nọ n’ezinaụlọ a gosiri ụwa ndị ha bụ. Ha gụnyere Pius nke bụ “economist” kajara akaja, Christopher nke bụ nnukwu odee na Bede nke bụ “plant pathologist.” Ezinaụlọ ha bukwara ibu n’Ojoto. Ọ bụ nna ha, Eze Ọkigbo, na-agagharị mgbe gboo na-agwa ndị Ojoto ka ha ziga ụmụ ha ụlọakwụkwọ.
Pius Okigbo
Pius Okigbo

Chris okigbo
Christopher Okigbo

Bede Okigbo
Bede Okigbo

  • Atụchukwu: Chief B. N bụ onye e weere dịka onye oji ego achụ ego mbụ n’obodo ha bụ Amichi. Aha ezinaụlọ a gbasakwara ebe dum maka ọ bụ na be ha ka ndị Biafra nyefere ndị Naịjirịa ihe dum, mgbe ha chịliiri ha aka elu n’agha. Ọzọ, ezinaụlọ a enweela dọkịta bekee ndị a ma ama tinyere ndị ọzọ bụkwa ọkaibe n’ọrụ ha.
  • Amobi: ezinaụlọ Amobi bụ nnukwu ezinaụlọ ọchịchị ọdịnala dị na be ha bụ Ogidi n’oge gara aga. Mmadụ anọ na be ha achịala ndị Ogidi dịka eze. Walter Amobi bụ eze ikpeazụ na be ha. Ọ nwụrụ n’afọ 1996, tutu obodo ha amalitezịa ibugharị ọchịchị ọdịnala ha.
  • Emeka: Igwe John Emeka n’Anam bụ onye mere e ji mara ezinaụlọ a. Ọ bụ onye oji ego achụ ego, bụrụkwa “contractor.” Ezinaụlọ a enweela osote gọvanọ Anambra, nweekwa mịnịsta.
  • Onyemelụkwe: ezinaụlọ Onyemelụkwe na Nanka nwere ugwu. Ha enweela Bishop bụ onye nke abụọ n’ụka ndị Anglican na Naịjirịa. Ha nwekwara Engr. Clement bụ njinịa kajara akaja n’eletrik. Ha nwekwara ndị ọzọ kpara ike n’akaọrụ ha na Naịjirịa.
Bishop Onyemelukwe
Bishop Onyemelukwe

  • Tabansi: ndị a bụ ndị hibere “Tabansi Motors” na “Press.” Ha si Nri ma bụrụkwa ezinaụlọ a ma ama n’Anambra Steeti maka ike ha kpara n’ahịa ha. Ọ bụkwa ha nwe “Tabansi Record” n’oge gara aga.
Tabansi Studio
Tabansi Record

  • Ezenwa: Ezenwa n’Ọba bụ ndị a ma ama dịka ndị ọchịchị ọdịnala n’obodo ha. Nna ha Eze Okpko so na ndị ọchịchị ọdịnala welitere isi oge ọ dị ndụ n’Anambra Steeti. Ụmụ ha na-emekwa ọfụma ma n’ahịa ha, ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ.
Eze Okpoko
Eze Okpoko

  • Ụbajiaka: Ụbajiaka bụ nnukwu ezinaụlọ na Nnewi. Nna ha bụ nnukwu transporter, bụrụkwa onye hibere “Izuchukwu Transport.” Oge ugbua, ụmụ ya gbadokwara anya ka akụnaụba nna ha ghara ifu. Otu nọ n’ahịa banyere ahụike nke nwekwara “Agary Pharmaceuticals.” Ọzọ kwụ chịm na “ICT.”
Analgesiscs Agary 2
Agary Pharmaceuticals
  • Ọnwụgbenu: Ọnwụgbenu bụ ezinaụlọ a ma ama nke ọma dịka ndị ahịa na Nnewi. Ọ bụ ha nwe “Iju industries” na “Louis Carter.”
Louis Carter Onwugbenu
Louis Carter Onwugbenu

Paschal Nwankw deere nke a n’ass Bekee, any wee tghara ya. Edemede ya d na weeb sat anambrapeople.com.ng.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.