Ncheta Ọkammụta Chinụalụmọgụ Achebe

N’ụbọchị taa n’afọ 2013 ka Chinụa Achebe nwụrụ. Na ndụ ya, Chinụa bụ onye Ogidi nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ nke Anambra Steeti. A mụrụ ya n’afọ 1930. Ọ bụ nnukwu ode akwụkwọ ụwa dum mara. A nabatara ya ịgụ ma mụọ banyere dibịa Bekee na mahadum Ibadan, mana ọ gbanwere ya gụọ “English and Literature.”

Chinụa Achebe abụghị onye ọchịchị ọbụla na ndụ ya n’ala anyị, mana o ji mkpịsịodee ya wee kpaa ike dị egwu. Ụfọdụ akwụkwọ ya kọwaara ụmụ ụwa ụzọ ndị Igbo, tụmadị ịgba mbọ na amamihe ha ji ebi ndụ ha. Ọzọ dị ka ibe ya, akwụkwọ ụfọdụ o dere, rụtụrụ aka n’ihe na-eme ka ala Naịjirịa ghara ịga n’ihu dịka o si kwesị.

Chinụa Achebe kụziri nkụzi n’ụlọakwụkwọ “Merchants of Light”dị n’Ọba, tutu o si ebe ahụ gaa malite ọrụ na “Nigerian Broadcasting Service” na Legọs.

Ọ bụ ebe a ka ọ malitere dewe akwụkwọ ya bụ “Things Fall Apart” nke e bipụtara n’ụbọchị iri na asaa n’ọnwa June n’afọ 1958. Akwụkwọ a mechara bụrụ ọkaibe. A tụgharịala akwụkwọ a n’asụsụ karịrị iri ise n’ụwa dum. Erekwaala ihe karịrị nde iri abụọ e bipụtara.

Chinụa lụrụ nwunye ya bụ Chinwe Okoli n’afọ 1961. Chinwe mụrụ Ada ha nwaanyị nke a gụrụ Chinelo n’afọ 1962. N’afọ 1964 ka a mụrụ ọkpara ha bụ Ikechukwu. E mechaa mụọ Chidị n’afọ 1967, tinyere ọdụdụ nwa ha nwaanyị bụ Nwando n’afọ 1970.

Chinụa Achebe a nwụọla mana ụwa niile, tinyere ala Igbo echezọbeghị ike odogwu nwoke a ji mkpịsị ya wee kpaa.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.