DKT. S.E. ỌNWỤ

IMG 20220604 060141
Dr Ọnwụ

A mụrụ Dkt. Simon Ezevuo Ọnwụ n’abalị 28 nke ọnwa Disemba, 1908 n’obodo ya bụ Afa(Affa), nke dị n’okpuru ọchịchị Udi na steeti Enugwu. Aha nna ya bu Chiifu Amadị Ọnwụbụnta, nke nne ya abụrụ Madam Nwalute Ọnwụbụnta.
S.E. Ọnwụ gụrụ akwụkwọ praịmarị ya na “St. Mary’s School” dị n’Ọnịcha. Ọ malitere akwụkwọ sekọndịrị ya na “Wesley Boys High School” dị na Legọs, mesịa banye “Kings College” n’otu Legọs ahụ. Mgbe ọ gụchabeghị akwụkwọ sekọndịrị n’afọ 1924 ka o sooro onye ọ tụkwasịrị obi bụ Chiifu Onyeama Ọnwụsị gaa njem na mba United Kingdom. O mesịrị gaghachi Lọndọn na 1925 maka agụmakwụkwọ ma mesịa nweta nzere “London Matriculation Certificate” n’afọ 1927.

N’afọ 1932 ka o nwetara nzere “MB” na “ChB” site n’ụlọakwụkwọ a kpọrọ “University of Edinburgh Medical School”, nke mere ka ọ bụrụ nwaafọ Igbo mbụ  Bụ dọkịta ahụike. Ọ gụkwuru ihe gbasara ahụike n’ụlọakwụkwọ ndị ọzọ na mba ofesi.


Ọnwụ lọghachiri Naịjirịa n’afọ 1933 ma bụrụ onye nlekọta ahụike n’ogo n’obodo Port-Hacourt. Ọ rụrụ ọrụ gbasara ahụike n’ọtụtụ ebe na Naịjirịa ruo ihe dị ka afọ 27. N’afọ 1957 ka ọ ghọrọ onye Afrịka mbụ e mere “Director of Medical Services, Eastern Nigeria”. O nwetara “Coronation Medal” na onyinye nkwanye ugwu ndị ọzọ site n’aka Ezenwaanyị Elizabet nke abụọ. Ndị ụka Katọliki chiri ya echichi “Pepal Order of the Knight of Saint Sylvester” n’afọ 1968 ma nyekwa ya ọkwa ndị ọzọ n’ihi otu o siri jiri ụka kpọrọ ihe.


N’abalị 13 nke ọnwa Septemba, n’afọ 1961 ka kọmitii nke Dọkịta Ọnwụ nọ n’isioche ya nwere nzukọ na WTC, Enugwu ma wepụta ọtọgrafị (orthography) e ji ede asụsụ Igbo ugbua, nke nwere mkpụrụedemede 36. Nke a mere ka ndọrọndọrọ malitere kemgbe afọ 1929 n’ihe gbasara ọtọgrafị Igbo bie n’afọ ahụ bụ 1961.
N’eziokwu, ọ ga-ewe ogologo oge iji kwuchaa gbasara ọkwa niile na ihe nrita niile Dọkịta Ọnwụ nwetara oge ọ nọ ndụ. Ọ bụ n’oge agha Biafra ka ọrịa riawara ya, nke mere ka e buru ya gawa Lọndọn. N’abalị 4 nke ọnwa Juun n’afọ 1969 ka Dọkịta Ọnwụ nwụrụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.