Ọkpara N’Ala Igbo

Text 4 Wkbk

N’ihe ọbụla n’ụwa, a na-enwe ihe mbụ, ihe abụọ, ihe atọ, ruo nke ikpeazụ. 

Mmadụ dum agaghị aha. Mmadụ ga-akarịrị ibe ya. Gwa m ebe mmadụ dum nọ n’otu ọkwa. O nweghị ebe ọ bụ. Arụsị karịrị arụsị. Odogwu na-akarị odogwu. Dịbia ji otu mkpọrọgwụ karịa ibe ya. Isi na isi ha bụ n’ọnụ. Ọkpara bụ isi a hụrụ kwaa okpu. Ọkpara bụ isi nkuku ụlọ. Ọkpara bụ a gbawo dike izu, a gbaa ya mgba. Ihe kọrọ ezinaụlọ enweghị ọkpara. Ezinaụlọ enweghị ọkpara bụ ezinaụlọ nwoke kọrọ. Ọ bụ ezinaụlọ ụmụnwaanyị. Ọkpara bụ ọpụrụiche.

Ọkpara abụghị echichi a na-echi echi. Ọ bụghị mmadụ na-eme onwe ya ọkpara. Ọ bụ Eke kere ụwa, kere mmadụ ịbụ ọkpara. A naghị ere ọnọdụ ọkpara n’ahịa, a naghịkwa azụta ya n’ahịa ọbụla. Onye bụ ọkpara? Mmadu dum apụrụ ịghọ ọkpara? Onye abụghị ọkpara ụnyaahụ, o nwere ike ịghọ ọkpara echi? Ọdịghị mfe! Ọkpara bụ nwa nwoke mbụ a mụrụ n’ezinaụlọ. Ọkpara aghaghị ịbụ nwoke mbụ nke ezinaụlọ. Ya bụ naanị nwoke mbụ mepere akpanwa nne ya. Ọ bụrụ na a mụghị gị dịka ọkpara, ị gaghị abụ ọkpara ruo ụbọchị ị ga anwụ. Ị bụrụkwanụ ọkpara malite ụbọchị a mụrụ gị, ọkpara ka ị ga-abụ rue n’ọnwụ gị. N’ọnwụ gị a gakwa na-akpọ gị ọkpara. 

Dịka Igbo na-asụ n’olu n’olu, ụfọdụ mba na-akpọ ya ọpara. Ndị Ụmụahịa so na ndị na-akpọ ya ọpara. N’ala Ụmụahịa, e nwere  nnukwu obodo bụ Ụmụọpara. Ụfọdụ obodo n’ala  Imo na-akpọ ya diọkpara. Obodo ọzọ na-akpọ ya Ọkwara. Ihe a kpọrọ ya adịghị mkpa, ihe dị mkpa bụ na Ọkpara bụ nwa nwoke mbụ bịara ụwa n’ezinaụlọ. 

Ndị bụ ọkpara, dịokpara, ọpara ahaghị aha. Ọkpara karịrị ibe ya. E nwere ọkpara nna, onye bụ ọkpara nwoke. Ọ bụ ya ka a na-echeta mgbe ọbụla a na-ekwu okwu ọkpara. Ya bụ nwoke mbụ nna ya mụrụ. N’aka nke ọzọ, e nwere ọkpara nwaanyị onye bụ obere ọkpara. Ụdị ọkpara a nwere ọnụ okwu n’ihe gbasara naanị nne ya. Ọ bụ ya ka a mụrụ dịka nwoke mbụ nke nne ya.  Igbo sị na ọ bụ n’obere mmiri ka nshịkọ na-echi eze.  N’ala ndị isi ka onye otu anya na-abụ ọgaranya.

Oge ndị Igbo na-alụ ọtụtụ nwunye, nwunye ọbụla bu ụzọ mụọ nwoke abụrụla nne ọkpara. Nwunye ahụ nwere ike ịbụ nwaanyị ikpeazụ a lụtara. N’ihi na o bu ndị ọzọ ụzọ mụọ nwoke mere o jiri bụrụ nne ọkpara. Nwoke bịa, ọkpara abịarutela. Nna ahụ ezuola oke ụbọchị ahụ ọ mụtara nwoke bụ ọkpara.

Ọnwụ so n’ihe ọzọ na-enye nwoke ọnọdụ ọkpara. Ọ bụrụ na nwoke a mụrụ dịka ọkpara anwụọ, onye na-eso ya aghọọla ọkpara aka mere. Ihe dị iche bụ na ụmụ ya ga-eketa oke maka na ọ bụ ọkpara. A gaghị eji maka na ọ nwụrụ hapụ inye ụmụ ya ihe nketa nna ha dịka diọkpara.

Ọ bụ ọkpara na-eso nna ezinaụlọ. Nna na-aga, ọkpara ya esoro ya. A chọọ nna ma a hụghị ya, ọ bụ ọkpara ya na-anọchite ya tụmadị n’ihe gbasara omenala Igbo. Mgbe a bịara n’ezinaụlọ mmadụ, a na-ebu ụzọ ajụ ase nna na Ọkpara ya. Ọkpara bụ “ahụ nwa  echeta nna ya.” Ọkpara bụ oyiri nna ya, ogbo nna ya na enyi nna ya. Ihe ọkpara na-alụrụ ezinaụlọ nna ya buru ibu. Dịka onye bichiri ụzọ adịghị nma ịbụ ogbenye, otu a ka ọkpara ekwesịghị ịbụ onye ogbenye. Ọ bụrụ na-enwere onye kwesịrị iji akụnaụba, Ọkpara bụ onye ahụ. Ọ bụrụ na e nwere onye adịghị mma ka ụbịam rute ya, ọkpara bụ onye ahụ.

Ọ bụ ọrụ ọkpara ịzụ ụmụnne ya niile. Ọkpara kwesịrị ịzụ ụmụnne ya, ma mee ha ka ha bụrụ mmadụ. Nke a dịkarịrị ihe n’ezinaụlọ nna ha nwụrụ anwụ maọbụ nna ha karala nka. Mgbe nna anoghịzị ndụ, ọ bụ ọkpara ka ọrụ niile nna ya nwere dịzịrị . O kwesịrị iziga ndị chọrọ ịgụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ, zigakwa ndị chọrọ ịmụ ọrụaka maọbụ ndị chọrọ ịzụ ahịa ebe ha ga-eme otu ahụ.

Ọ bụrụ onye maara ọdịnala, ọkpara ga na-agọrọ ha ọfọ ogologo ndụ, ahụike, ọmụmụ na ihe ọma dum. Ọkpara so enye iwu n’ezinaụlọ. O sokwa ahụ na onye ọbụla dobere iwu. Ọkpara nwere ike ịta nwanne ya ọbụla dara iwu ahụhụ.

Ihe m katọrọ ebe ndị ọkpara nọ bụ ire ala nna ha. N’omenala  nyere ọkpara oghere ire ala abụghị nke ire ala ha dịka ndị iberibe. Ọ bụ gị nwe ala ị na-erefu otu a? Ọ bụrụ na ahapụghịrị gị ala, kedụ nke ị ga-ere? Ebe ọ bụ na a hapụụrụ gị ala, ị maghi na ị kwesịrị ị hapụrụ  ndị ọzọ ala?

Na ọ jọka njọ ihe ọkpara kwesịrị ime bụ iji ala ha nara ego nke bụ na mgbe ọbụla ego bịara, ha nwere oghere inataghachi ala ha. N’agba nke mbụ, ekwuru m okwu banyere ọrụ na-eche ndị bụ ọkpara n’ihu. Ka m kwuo okwu banyere ọrụ ọzọ na uru ha na-erite.

Ọ bụ ọrụ dịịrị ọkpara ili nna ya mgbe ọ nwụrụ. Nna hapụ ụwa laa mmụọ, ọ bụ ọkpara ya ga-ahụ maka akwamozu ya. Ọkpara ya ga-ahụ na a kwara nna ya nwụrụ anwụ nke ọma. Ọ bụrụ na nna ya banyere otu ọdịnala, ọkpara ya gakwa abanye n’otu ọdịnala ahụ ka o nwee ike ili nna ya otu o kwesịrị. Nke a mere na ndị nna na-etinye ọkpara ya n’otu ọdịnala ha oge ha nọ ndụ.

Oge ndị obodo m na-eme mmemme a kpọrọ Ọkọnkọ, nna na-etinye nwa ya n’ọkọnkọ. Ọ bụrụ na nwa ya ka bụ obere nwa, o nwere nke a na-etinye ya, nke bụ na mgbe o tolitere ọ banye nke nna ya.  Ọkpara ya ga-eme emume a na-akpọ ịkpụ ụlo. Ịkpụ ụlọ bu mmadụ ịhụ na ọ matara ihe bụ ọkọnkọ. Nke a bụ maka ndị torola eto. Cheta na oge Nnamdị Azikiwe nwụrụ, ọkpara ya bụ Chukwuma Azikiwe banyere n’otu Agbaranze ka o nwee ike isoro n’olili ozu nna ya.

Ọ na-abụ ihe ihere ọkpara anọghị oge a dọnyere ozu nna ya n’ili. N’oge gboo, ụdị ọkpara a na-anata ụtalị ndị mmụọ. Iji hụ na e liziri nna mere ụfọdụ ọkpara na akpataghị ego ji ebiri ego maọbụ ree ala maka olili ozu nna  ha. Mgbe a na-ekuchi nwaanyị n’ekpe, ọ bụ ọkpara na-ekuchi nwunye nna ya. Ọ bụrụ na ọ chọghị ikpuchi. Ọ bụkwa ya ga-enye nwanne ya nwoke ike ikuchi nwunye nna ha.

Ọ bụ “omenelu” nwa abụghị ọkpara ikuchi nwunye nna ha. Ọkpara kuchiri nwunye nna ya ji nwaanyị ahụ ụgwọ ileta ya anya dịka nna ya letara ya anya oge ọ dị ndụ. A tụkwara ọkpara anya ileta ya anya nke ọma. Ileta nwunye nna ya anya gụnyere inye ya ala niile kwesịrị ka e nye ya, ịnyeju ya nri afọ, ịzụrụ ya akwa, wdgz.

Ọ bụrụ ezinaụlọ nna ji ụgwọ tupu ọ laa mmụọ, ụgwọ niile ahụ adakwasịla n’isi ọkpara ya. Ọ bụ ya ga-akwụ ụgwọ nna ya ji. Ọ dịịrị ya ịhazi ya otu ọ ga-esi akwụ ụgwọ ahụ. Ọ na-arahụ ụra, ọ ga na-eche ihe ọ ga-eme ka aha ezinaụlọ ha guzosie ike.

Ọkpara bụ nne ọkụkọ ji ụmụ nke anaghị agba nnukwu ọsọ. Ọ na-eme ihe ọbụla ọ na-eme, ọ ga na-eche maka ezinaụlọ ya. O kwesịghị ịnụ mmanya mgbe ụmụnne ya anụbeghị mmanya. Ọ ka mma na ọkpara erighị nri ka nri zuo ụmụnne ya. Ọkpara bụ ọkpara, bụrụkwa nna.

Ọkpara jiri akanri ya na-alụrụ ezinaụlọ ha ọrụ, ọ na-eji akaekpe ya na-anata ihe nketa ya. N’obodo m, ọkpara na-ebichi n’obi nna ya. A naghị eke obi nna mmadụ eke, ọ bụ ihe nketa ọkpara. Ụnu enwekwarala ya anyaukwu. Unu gara ebe ole oge ọ na-arụ ọrụ? Ọ bụ ugbu a ọ lụrụla n’anwụ kwesịrị ka o rie na ndo ka unu na-enwere ya anyaụfụ? Onye na-ahụ ihe ọkpara na-eri, ọ nakwa ahụ ihe ọkpara na-arụ, ka ọ bụ na ogbu opi ekwesịghị ihicha imi? 

Odee: Iwuọha Prince

Ekwentị: +2348138460701


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.